< 1 Ihe E Mere 2 >

1 Izrel mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a: Ruben, Simiọn, Livayị, Juda, Isaka, na Zebụlọn,
イスラエルの子らは次のとおりである。ルベン、シメオン、レビ、ユダ、イッサカル、ゼブルン、
2 Dan, Josef, Benjamin, Naftalị, Gad na Asha.
ダン、ヨセフ、ベニヤミン、ナフタリ、ガド、アセル。
3 Juda mụtara ụmụ ndị ikom atọ site na nwunye ya Bat-shua, onye Kenan. Aha ha bụ Ịa, Onan na Shela. Ma Ịa ọkpara Juda bụ nnọọ mmadụ ọjọọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị gburu ya.
ユダの子らはエル、オナン、シラである。この三人はカナンの女バテシュアがユダによって産んだ者である。ユダの長子エルは主の前に悪を行ったので、主は彼を殺された。
4 Juda mụtakwara ụmụ nwoke abụọ ọzọ, Perez na Zera, site na Tama nwunye nwa ya nwoke. Ụmụ ndị nwoke niile Juda dị ise.
ユダの嫁タマルはユダによってペレヅとゼラを産んだ。ユダの子らは合わせて五人である。
5 Ụmụ ndị ikom Perez bụ, Hezrọn na Hamul.
ペレヅの子らはヘヅロンとハムル。
6 Zera mụrụ: Zimri, na Etan, na Heman, na Kalkol, na Dara. Ha dị ndị ikom ise nʼọnụọgụgụ.
ゼラの子らはジムリ、エタン、ヘマン、カルコル、ダラで、合わせて五人である。
7 Ekan nwa Kami, bụ onye ahụ tinyere ndị Izrel na nsogbu, site nʼihe o mere nke gbasara ihe e doro nsọ.
カルミの子はアカル。アカルは奉納物について罪を犯し、イスラエルを悩ました者である。
8 Etan mụrụ Azaraya.
エタンの子はアザリヤである。
9 Hezrọn mụtara Jerameel, Ram na Kaleb.
ヘヅロンに生れた子らはエラメル、ラム、ケルバイである。
10 Ram mụrụ Aminadab, Aminadab amụọ Nashọn onyendu a maara ama na Juda.
ラムはアミナダブを生み、アミナダブはユダの子孫のつかさナションを生んだ。
11 Nashọn mụrụ Salma, Salma amụọ Boaz.
ナションはサルマを生み、サルマはボアズを生み、
12 Boaz amụta Obed, Obed amụọ Jesi.
ボアズはオベデを生み、オベデはエッサイを生んだ。
13 Nwa nwoke mbụ Jesi mụrụ bụ Eliab; nke abụọ bụ Abinadab, nke atọ bụ Shimea.
エッサイは長子エリアブ、次にアビナダブ、第三にシメア、
14 Nke anọ bụ Netanel, nke ise bụ Radai,
第四にネタンエル、第五にラダイ、
15 nke isii Ozem, nke asaa Devid.
第六にオゼム、第七にダビデを生んだ。
16 Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya, ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel.
彼らの姉妹はゼルヤとアビガイルである。ゼルヤの産んだ子はアビシャイ、ヨアブ、アサヘルの三人である。
17 Abigel, nwunye Jeta onye Ishmel mụrụ Amasa.
アビガイルはアマサを産んだ。アマサの父はイシマエルびとエテルである。
18 Kaleb nwa Hezrọn lụrụ ụmụ nwanyị abụọ, Azuba na Jeriọt. Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom ndị a Jesha, Shobab na Adọn.
ヘヅロンの子カレブはその妻アズバおよびエリオテによって子をもうけた。その子らはエシル、ショバブ、アルドンである。
19 Mgbe Azuba nwụrụ, Kaleb lụrụ nwunye ọzọ. Aha ya bụ Efrat, onye mụtaara ya Hua.
カレブはアズバが死んだのでエフラタをめとった。エフラタはカレブによってホルを産んだ。
20 Hua mụrụ Uri, Uri mụtara Bezalel.
ホルはウリを生み、ウリはベザレルを生んだ。
21 Mgbe Hezrọn gbara iri afọ isii, ọ lụrụ ada Makia onye mụtaara ya Segub. Makia bụ nna Gilead.
そののちヘヅロンはギレアデの父マキルの娘の所にはいった。彼が彼女をめとったときは六十歳であった。彼女はヘヅロンによってセグブを産んだ。
22 Segub mụrụ Jaịa, onye chịrị iri obodo abụọ na atọ na Gilead.
セグブはヤイルを生んだ。ヤイルはギレアデの地に二十三の町をもっていた。
23 Ma Geshua na Aram dọtara obodo Jaịa nʼagha, dọtakwa Kenat nʼagha, ya na iri obodo nta isii ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị a niile bụ ụmụ Makia nna Gilead.
しかしゲシュルとアラムは彼らからハボテ・ヤイルおよびケナテとその村里など合わせて六十の町を取った。これらはみなギレアデの父マキルの子孫であった。
24 Mgbe Hezrọn nwụrụ nʼobodo Kaleb Efrata, Abija nwunye Hezrọn mụtaara ya Ashua, onye bụ nna Tekoa.
ヘヅロンが死んだのち、カレブは父ヘヅロンの妻エフラタの所にはいった。彼女は彼にテコアの父アシュルを産んだ。
25 Jerameel ọkpara Hezrọn mụtara Ram, onye bụ ọkpara ya, mụọkwa Buna, na Oren, na Ozem, na Ahija.
ヘヅロンの長子エラメルの子らは長子ラム、次はブナ、オレン、オゼム、アヒヤである。
26 Nwunye Jerameel nke abụọ, aha ya bụ Atara, mụtara Onam.
エラメルはまたほかの妻をもっていた。名をアタラといって、オナムの母である。
27 Ram ọkpara Jerameel mụtara ụmụ ndị ikom ndị a: Maaz, na Jamin, na Eka.
エラメルの長子ラムの子らはマアツ、ヤミン、エケルである。
28 Ụmụ Onam mụrụ bụ Shamai, na Jada. Shamai mụkwara Nadab, na Abishua.
オナムの子らはシャンマイとヤダである。シャンマイの子らはナダブとアビシュルである。
29 Abishua na nwunye ya Abihail mụrụ Aban, na Molid.
アビシュルの妻の名はアビハイルといって、アバンとモリデを産んだ。
30 Ụmụ Nadab mụrụ bụ Seled, na Apaim. Seled nwụrụ na-amụtaghị nwa ọbụla.
ナダブの子らはセレデとアッパイムである。セレデは子をもたずに死んだ。
31 Ma Apaim mụtara Ishi. Ishi mụrụ Sheshan, Sheshan amụtakwa Alai.
アッパイムの子はイシ、イシの子はセシャン、セシャンの子はアヘライである。
32 Jada nwanne Shamai mụtara ụmụ ndị ikom abụọ, Jeta na Jonatan. Jeta amụtaghị nwa ọbụla,
シャンマイの兄弟ヤダの子らはエテルとヨナタンである。エテルは子をもたずに死んだ。
33 ma Jonatan mụtara ụmụ ndị ikom abụọ: Pelet na Zaza. Ndị a bụ ụmụ Jerameel.
ヨナタンの子らはペレテとザザである。以上はエラメルの子孫である。
34 Sheshan mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị, ma o nweghị nwa nwoke. O nwere otu ohu bụ onye Ijipt, aha ya bụ Jaha.
セシャンには男の子はなく、ただ女の子のみであったが、彼はヤルハと呼ぶエジプトびとの奴隷をもっていたので、
35 O weere ada ya nwanyị nye odibo ya bụ Jaha, ka ọ bụrụ nwunye ya. Ọ mụtara ya otu nwa nwoke aha ya bụ Atai.
セシャンは娘を奴隷ヤルハに与えてその妻とさせた。彼女はヤルハによってアッタイを産んだ。
36 Atai mụrụ Netan, Netan mụrụ Zabad,
アッタイはナタンを生み、ナタンはザバデを生み、
37 Zabad amụọ Eflal. Nwa Eflal bụ Obed,
ザバデはエフラルを生み、エフラルはオベデを生み、
38 ma Obed mụrụ Jehu. Jehu amụọ Azaraya.
オベデはエヒウを生み、エヒウはアザリヤを生み、
39 Azaraya bụ nna Helez, Helez mụrụ Eleasa.
アザリヤはヘレヅを生み、ヘレヅはエレアサを生み、
40 Eleasa mụrụ Sismai, Sismai amụọ Shalum.
エレアサはシスマイを生み、シスマイはシャルムを生み、
41 Shalum bụ nna Jekamaya, ebe Jekamaya mụrụ Elishama.
シャルムはエカミヤを生み、エカミヤはエリシャマを生んだ。
42 Ụmụ ndị ikom Kaleb nwanne Jerameel bụ Mesha onye bụ ọkpara ya, nna Zif, onye mụrụ Maresha nna Hebrọn.
エラメルの兄弟であるカレブの子らは長子をマレシャといってジフの父である。マレシャの子はヘブロン。
43 Hebrọn mụrụ ndị a: Kora, Tapụọa, Rekem na Shema.
ヘブロンの子らはコラ、タップア、レケム、シマである。
44 Shema mụrụ Raham, onye bụ nna Jokean. Rekem mụrụ Shamai.
シマはラハムを生んだ。ラハムはヨルカムの父である。またレケムはシャンマイを生んだ。
45 Ọkpara Shamai bụ Maon, onye mụrụ Bet Zoa.
シャンマイの子はマオン。マオンはベテヅルの父である。
46 Efaa, iko nwanyị Kaleb, mụtaara ya Haran, Moza na Gazez. Haran mụtakwara nwa ọ kpọrọ aha ya Gazez.
カレブのそばめエパはハラン、モザ、ガゼズを産んだ。ハランはガゼズを生んだ。
47 Jadia mụtara ndị ikom ndị a: Regem, Jotam, Gesham, Pelet, Efaa na Shaaf.
エダイの子らはレゲム、ヨタム、ゲシャン、ペレテ、エパ、シャフである。
48 Maaka, iko nwanyị ọzọ Kaleb nwere mụtaara ya ndị a: Sheba na Tiahana,
カレブのそばめマアカはシベルとテルハナを産み、
49 ọ mụtakwara Shaaf, onye bụ nna Madmanna, Sheva nna Makbena, tinyere Gibea. Aha nwa nwanyị Kaleb mụtara bụ Aksa.
またマデマンナの父シャフおよびマクベナとギベアの父シワを産んだ。カレブの娘はアクサである。
50 Ndị a bụ ụmụ Kaleb. Ụmụ Hua, ọkpara Efrata mụrụ bụ, Shobal, nna Kiriat Jearim,
これらはカレブの子孫であった。エフラタの長子ホルの子らはキリアテ・ヤリムの父ショバル、
51 Salma nna Betlehem, na Haref, nna Bet-Gadea.
ベツレヘムの父サルマおよびベテガデルの父ハレフである。
52 Ụmụ Shobal nna Kiriat Jearim mụrụ bụ Haroe, onye mụrụ ọkara ndị ikwu Menuhot.
キリアテ・ヤリムの父ショバル子らはハロエとメヌコテびとの半ばである。
53 Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
キリアテ・ヤリムの氏族はイテルびと、プテびと、シュマびと、ミシラびとであって、これらからザレアびとおよびエシタオルびとが出た。
54 Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.
サルマの子らはベツレヘム、ネトパびと、アタロテ・ベテ・ヨアブ、マナハテびとの半ばおよびゾリびとである。
55 Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.
またヤベヅに住んでいた書記の氏族テラテびと、シメアテびと、スカテびとである。これらはケニびとであってレカブの家の先祖ハマテから出た者である。

< 1 Ihe E Mere 2 >