< 1 Ihe E Mere 19 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Nahash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Some time later, Nahash, king of the Ammonites, died and his son succeeded him.
2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere nʼihi na nna ya gosiri m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ozi Devid bịakwutere Hanọn nʼala ndị Amọn ịkasị ya obi,
David said, “I will be kind to Hanun, son of Nahash, for his father was kind to me.” So David sent messengers to comfort him over his father's death. David's ambassadors arrived in the land of the Ammonites and went comfort Hanun.
3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”
But the Ammonite princes said to Hanun, “Do you really think that David is honoring your father by sending comforters to you? Haven't these ‘comforters’ only come to spy out the land to find ways to conquer it?”
4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
So Hanun detained David's ambassadors and had them shaved, and their robes cut off at the buttocks. Then he sent them back.
5 Mgbe otu onye bịara zie Devid ihe banyere ndị ikom ahụ, o zipụrụ ndị ozi, ka ha gaa zute ha, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko tutu ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
A message was sent to David to explain what had happened to the men. David then sent messengers to the men to tell them, “Stay at Jericho until your beards grow, and then you can come back.”
6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, Hanọn na ndị Amọn zipụrụ otu puku talenti ọlaọcha iji gbazite ụgbọ agha na ndị na-agba ụgbọ agha site na Aram Naharaim, na Aram Maaka, nakwa Zoba.
Then the Ammonites realized that they had really been offensive to David So Hanun and the Ammonites sent a thousand talents of silver to hire chariots and charioteers from Aram-naharaim, Aram-maacah, and Zobah.
7 Ha goro ụgbọ agha ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, na puku abụọ. Ha gokwara eze Maaka na ndị agha ya, ndị bịara maa ụlọ ikwu agha ha na nso Medeba, ebe ndị Amọn sikwa nʼobodo ha niile chịkọta onwe ha pụta ịlụ agha.
They also hired 32,000 chariots and the king of Maacah with his army. They came set up camp near Medeba. The Ammonites were also called up from their towns and prepared for battle.
8 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
When David learned of this, he sent Joab and the entire army to confront them.
9 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ma ndị eze ahụ bịara agha, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
The Ammonites set up their battle lines near the town entrance, while the other kings who had joined them took up positions in the open fields.
10 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
Joab realized he would have to fight both in front of him and behind him, he chose some of Israel's best troops and he took charge of them to lead the attack the Arameans.
11 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, e zipụrụ ha izute ndị Amọn nʼagha.
He put the rest of the army under the command of Abishai, his brother. They were to attack the Ammonites.
12 Mgbe Abishai na-apụ, Joab gwara ya okwu sị ya, “Ọ bụrụ na ndị Aram esie ike karịa m, mgbe ahụ, ị ga-abịa napụta m. Ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn adịrị ike karịa gị, aga m abịa napụta gị.
Joab told him, “If the Arameans are stronger than me, you come and help me. If the Ammonites are stronger than you, I'll come and help you.
13 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
Be brave, and fight your best for our people and the towns of our God. May the Lord do what he sees as good!”
14 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
Joab attacked the Arameans with his forces and they ran away from him.
15 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwaara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab laghachiri na Jerusalem.
When the Ammonites saw that the Arameans had run away, they also ran away from Abishai, Joab's brother, and retreated into the town. So Joab went back to Jerusalem.
16 Ma mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha, ha zipụrụ ndị ozi gara kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ọ bụ Shofaka ọchịagha ndị agha Hadadeza na-edu ha.
As soon as the Arameans saw they had been defeated by the Israelites so they sent for reinforcements from the other side of the Euphrates River, under the leadership of Shobach, commander of Hadadezer's army.
17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, pụọ gafee Jọdan. O gara nso imegide ha, o doro usoro agha ya na ncherita ihu ha. Devid doro usoro ndị agha ya izute ndị Aram nʼagha, ha lụsokwara ya agha.
When this was reported to David, he assembled all Israel together. He crossed the Jordan and approached the Aramean army, drawing up his forces in battle line against them. When David engaged in battle with them they fought with him.
18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ. Devid gburu puku asaa nʼime ndị ikom na-anya ụgbọ agha, gbukwaa iri puku ndị agha anọ ndị na-eji ụkwụ eje. O gbukwara Shofaka, bụ ọchịagha agha ha.
But the Aramean army ran away from the Israelites, and David killed 7,000 charioteers and 40,000 infantry, as well as Shobach, their army commander.
19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na Devid dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ya. Ya mere, ndị Aram adịghịkwa njikere inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.
When Hadadezer's allies realized that they had been defeated by Israel, they made peace with David and became subject to him. As a result, the Arameans didn't want to help the Ammonites any more.

< 1 Ihe E Mere 19 >