< 1 Ihe E Mere 18 >
1 Mgbe nke a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia, mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Gat na obodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu site nʼaka ndị Filistia.
此後,大衛攻打非利士人,把他們治服,從他們手下奪取了迦特和屬迦特的村莊;
2 Devid merikwara ndị Moab, ha ghọrọ ndị ohu ya, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
又攻打摩押,摩押人就歸服大衛,給他進貢。
3 Devid merikwara Hadadeza eze Zoba, na nso Hamat, mgbe ọ na-aga iguzobe ogidi eji mara ya nʼakụkụ osimiri Yufretis.
瑣巴王哈大利謝往幼發拉底河去,要堅定自己的國權,大衛就攻打他,直到哈馬,
4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
奪了他的戰車一千,馬兵七千,步兵二萬,將拉戰車的馬砍斷蹄筋,但留下一百輛車的馬。
5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
大馬士革的亞蘭人來幫助瑣巴王哈大利謝,大衛就殺了亞蘭人二萬二千。
6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs, ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwara ya ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
於是大衛在大馬士革的亞蘭地設立防營,亞蘭人就歸服他,給他進貢。大衛無論往哪裏去,耶和華都使他得勝。
7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo nke ndịisi agha Hadadeza na-ebu na Jerusalem.
他奪了哈大利謝臣僕所拿的金盾牌帶到耶路撒冷。
8 Site na Tibhat nakwa Kun, bụ obodo ndị Hadadeza na-achị, Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu, nke Solomọn ji kpụọ Osimiri bronz ahụ, ogidi niile na ngwongwo ndị ọzọ niile nke e ji bronz kpụọ.
大衛又從屬哈大利謝的提巴和均二城中奪取了許多的銅。後來所羅門用此製造銅海、銅柱,和一切的銅器。
9 Mgbe Tou eze Hamat nụrụ na Devid emeriela ndị agha niile nke Hadadeza, eze Zoba,
哈馬王陀烏聽見大衛殺敗瑣巴王哈大利謝的全軍,
10 o zipụrụ Hadoram nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee eze Devid nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Hadoram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaedo, nke ọlaọcha na nke bronz dị iche iche bịa.
就打發他兒子哈多蘭去見大衛王,問他的安,為他祝福,因為他殺敗了哈大利謝(原來陀烏與哈大利謝常常爭戰)。哈多蘭帶了金銀銅的各樣器皿來。
11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek.
大衛王將這些器皿,並從各國奪來的金銀,就是從以東、摩押、亞捫、非利士、亞瑪力人所奪來的,都分別為聖獻給耶和華。
12 Abishai nwa Zeruaya gburu puku ndị Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu.
洗魯雅的兒子亞比篩在鹽谷擊殺了以東一萬八千人。
13 O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
大衛在以東地設立防營,以東人就都歸服他。大衛無論往哪裏去,耶和華都使他得勝。
14 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi.
大衛作以色列眾人的王,又向眾民秉公行義。
15 Joab nwa Zeruaya bụ onyeisi agha ya; Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta akụkọ.
洗魯雅的兒子約押作元帥;亞希律的兒子約沙法作史官;
16 Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja. Shavsha bụ ode akwụkwọ eze.
亞希突的兒子撒督和亞比亞他的兒子亞希米勒作祭司長;沙威沙作書記;
17 Benaya nwa Jehoiada bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndịisi nʼọrụ eze.
耶何耶大的兒子比拿雅統轄基利提人和比利提人。大衛的眾子都在王的左右作領袖。