< 1 Ihe E Mere 16 >

1 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ guzobe ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Ha chekwara aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Chineke.
Wakaleta ndani Sanduku la Mungu na kuweka katika ya hema ambalo Daudi aliandaa. Kisha wakatoa sadaka ya kuteketeza na sadaka ya ushirika mbele ya Mungu.
2 Mgbe Devid chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị.
Daudi alipo maliza kutoa dhabiu ya kuteketeza na sadaka za ushirika, aliwabariki watu kwa jina la Yahweh.
3 O nyekwara onye ọbụla nʼIzrel, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ.
Alisambaza kwa kila Misraeli, mwanaume na mwanamke, kipande cha mkate, na kipande cha nyama, na keki ya mzabibu.
4 Ọ họpụtara ụfọdụ ndị Livayị ka ha nọdụ nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ inye Onyenwe anyị, Chineke Izrel ekele na otuto na ịrịọ ya ngọzị nʼisi ndị ya Izrel. Ndị a bụ ndị o nyere ije ozi a:
Daudi aliewapangia baadhi ya Walawi kutumika mbele ya sanduku la Yahweh, na kusheherekea, kushukuru na kumsifu Yahweh, Mungu wa Israeli.
5 Asaf bụ onyeisi ndị a. Ndị ọzọ bụ Zekaraya, Jeiel, Shemiramot, Jehiel, Matitaia, Eliab, Benaya, Obed-Edọm na Jeiel. Ọrụ ha bụ ịkpọ ụbọ akwara, na une, ma ọrụ Asaf bụ onye na-akụ ogene ọla na-ada ụda.
Hawa Walawi walikuwa Asafu kiongozi, wa pili kutoka kwake Zekaria, Yeieli, Shemiramothi, Yehieli, Matithia, Eliabu, Benaia, Obedi Edomu, na Yeieli. Hawa walikuwa wacheze na vyombo vya uzi na vinubi. Asafu alikuwa apige upatu, kwa kelele.
6 Benaya na Jahaziel, ndị nchụaja, ketara ọrụ ịfụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke kwamgbe kwamgbe.
Benaia na Yahazieli walikuwa wakupiga tarumbeta kila mara, mbele sanduku la agano la Mungu.
7 Nʼụbọchị ahụ ka Devid buru ụzọ họpụta Asaf na ndị otu ya ka ha nye Onyenwe anyị otuto nʼusoro dị otu a:
Kisha katika hiyo siku Daudi akawachagua Asafu na kaka zake kuimba hii nyimbo ya shukurani kwa Yahweh.
8 Nyenụ Onyenwe anyị otuto, kwupụtakwa aha ya, meenụ ka amata nʼetiti mba niile banyere ihe niile ọ rụrụ.
Mpeni shukurani Yahweh, liitieni jina lake; fahamisheni mataifa matendo yake.
9 Bụkuonụ ya abụ, bụkuonụ ya abụ otuto; kwupụtaranụ mba niile ọrụ ebube ya niile.
Mwiimbieni, imbeni sifa kwake; semeni matendo yake ya ajabu.
10 Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa ọṅụ.
Jisifuni katika jina lake takatifu; mioyo ya wanao mtafuta Yahweh ishangilie.
11 Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
Mtafute Yahweh na nguvu zake; tafuteni uwepo wake siku zote.
12 Chetanụ ọrụ ebube niile nke ọ rụrụ, ihe ịrịbama ya niile na ikpe ziri ezi niile nke si nʼọnụ ya pụta.
Kumbukeni matendo aliyo ya fanya kwenu, miujiza yake na amri za kinywa chake,
13 Unu, ụmụ Izrel, bụ ohu ya ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.
enyi uzao wa Israeli mtumishi wake, enyi watu wa Yakobo, wateule wake.
14 Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị Chineke anyị; ikpe ya dị nʼụwa niile.
Yeye ni Yahweh, Mungu wetu. Amri zake zipo duniani kote.
15 Ọ na-echeta ọgbụgba ndụ ya ruo mgbe ebighị ebi; bụ nkwa o kwere nye puku ọgbọ.
Tunzeni agano lake akilini mwenu milele, neno alilo liamuru kwa vizazi elfu moja.
16 Ọgbụgba ndụ ahụ nke ya na Ebraham gbara, na iyi ọ ṅụrụ nye Aịzik.
Anakumbuka agano alilo lifanya na Ibrahimu, na nadhiri yake kwake Isaka.
17 O mere ka o guzoro nye Jekọb dịka ụkpụrụ, ma nʼebe Izrel nọ dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi:
Hili ndilo alilo lithibitisha kwa Yakobo kama amri maalumu, na kwa Israeli kama agano la milele.
18 Sị, “Aga m enye gị ala Kenan ka ọ bụrụ ihe nketa gị.”
Alisema, “Nitakupa nchi ya Kanani kama sehemu ya urithi wako.”
19 Mgbe ha dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, nʼezie, ole na ole, bụrụkwa ọbịa nʼala ahụ.
Nilisema hili mlipo kuwa wachache kwa idadi, wachache sana, mlipo kuwa wageni katika nchi.
20 Ha wagharịrị site nʼotu mba gaa mba ọzọ, sitekwa nʼotu alaeze gaa na alaeze ọzọ.
Walienda taifa hadi taifa, kutoka ufalme mmoja hadi mwingine.
21 O kweghị ka onye ọbụla mekpaa ha ahụ; ọ baara ndị eze mba nʼihi ha, sị:
Hakuwaruhusu yeyote awatese; aliwahadhibu wafalme kwa ajili yao.
22 “Unu emetụkwala ndị m e tere mmanụ aka, unu emekpakwala ndị amụma m ahụ.”
Alisema, “Msiwaguse wapakwa mafuta wangu, na msiwadhuru manabii wangu.”
23 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
Imbeni kwa Yahweh, dunia yote; tangazeni wokovu wake siku hadi siku.
24 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
Kirini utukufu wake kwa mataifa, matendo yake makuu kwa mataifa yote.
25 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, ọ bụkwa onye kachasị ka e nye otuto. Onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
Kwa kuwa Yahweh ni mkuu na ni wakusifiwa sana, na ni wakuogopewa kuliko miungu yote.
26 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
Kwa kuwa miungu ya mataifa ni sanamu, lakini ni Yahweh aliye umba mbingu.
27 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na ọṅụ dị nʼebe obibi ya.
Uzuri wa ajabu na utukufu upo uweponi mwake. Uwezo na furaha upo kwake.
28 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
Mpeni sifa Yahweh, enyi koo za watu, mpeni sifa Yahweh utukufu na uwezo;
29 E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya.
Mpeni Yahweh utukufu upasao jina lake. Leta sadaka na mje kwake. Muinamieni Yahweh katika utakatifu wa uzuri wake.
30 Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
Mtetemeke mbele zake, dunia yote. Dunia imeimarishwa; haiwezi kutikisika.
31 Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
Mbingu nazo ziwe nafuraha, na dunia ifurahi; na wasema kwa mataifa yote, “Yahweh anatawala.”
32 Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
Bahari na ingurume, na inayo ijaza ipige kelele kwa furaha. Mashamba yawe na furaha tele, na vyote vilivyomo ndani yake.
33 Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
Na miti iliyopo misituni ipige kelele kwa Yahweh, kwa kuwa anakuja kuhukumu dunia.
34 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Toeni shukurani kwa Yahweh, kwa kuwa ni mwema, uaminifu wa agano lake la dumu ata milele.
35 Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.”
Kisha sema, “Tuokoe, Mungu wa wokovu wetu. Tukusanye pamoja na utuokoe kutoka kwa mataifa mengine, ilikwamba tutoe shukurani kwa jina lako takatifu na tufurahi katika sifa zako.”
36 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”
Na Yahweh, Mungu wa Israeli, asifiwe kutoka milele na milele. Watu wote wakasema, “Amina” na wakamsifu Yahweh.
37 Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
Hivyo Daudi akamwacha Asafu na kaka zake pale mbele ya sanduku la Yahweh, kutumika daima mbele ya sanduku, kama kazi za kila siku zilivyo itaji. Obedi Edomu pamoja na ndugu sitini na nane walijumuishwa.
38 Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
Obedi Edomu mwana wa Yeduthuni, pamoja na Hosa, walikuwa wawe walinzi wa lango.
39 Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
Zadoki kuhani na makuhani wenzake walikuwa watumike mbele ya hema la Yahweh katika mahali pa juu huko Gibeoni.
40 Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.
Walikuwa watoe sadaka za kuteketeza kwa Yahweh kwenye madhabahu ya sadaka za kuteketeza daima asubui na jioni, kwa mujibu wa yote yalio andikwa katika amri za Yahweh, aliyo wapa Waisraeli kama sheria.
41 Devid họpụtakwara Heman, na Jedutun, na ndị ọzọ a kpọrọ aha họpụta inye Onyenwe anyị ekele, “nʼihi ịhụnanya ya na obi ebere ya nke na-adị ruo mgbe ebighị ebi.”
Hemani na Yeduthuni walikuwa nao, pamoja na walio chaguliwa kwa jina, kumpa shukurani Yahweh, kwasababu uaminifu wa agano lake la dumu ata milele
42 Heman na Jedutun bụ ndị ọ dịịrị ịfụ opi, na ịkụ ogene ọla, na ihe egwu ndị ọzọ eji na-enye Chineke otuto. Ụmụ ndị ikom Jedutun bụ ndị nọ nche nʼọnụ ụzọ ama.
Hemani na Yeduthuni walikuwa viongozi wa wao waliopiga tarumbeta, upatu, na vyombo vingine kwa muziki wa kumuabudu Mungu. Wana wa Yeduthuni walilinda lango.
43 Mgbe mmemme ahụ gwụsịrị, onye ọbụla lara nʼụlọ ya. Devid lakwara ịgọzi ezinaụlọ ya.
Kisha watu wote walirudi nyumbani, na Daudi akarudi kubariki nyumba yake.

< 1 Ihe E Mere 16 >