< 1 Ihe E Mere 15 >

1 Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya.
Daudi akajingea nyumba zake katika mji wa Daudi. Akaanda sehemu kwa ajili ya sanduku la Mungu na hema lake.
2 Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
Kisha Daudi akasema, “Walawi pekee ndio watabeba sanduku la Mungu, kwa kuwa walichaguliwa na Yahweh kubeba sanduku la Yahweh, na kumtumikia milele.”
3 Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.
Kisha Daudi akakusanya Israeli yote Yerusalemu, kuleta sanduku la Yahweh sehemu aliyo iandaa.
4 Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị:
Daudi akakusanya uzao wa Aruni na Walawi pamoja.
5 Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. Uriel bụ onyeisi ha.
Kutoka uzao wa Kohathi, palikuwa na Urieli kiongozi na ndugu zake, wanaume 120.
6 Ụmụ Merari na ụmụnna ha dị narị abụọ na iri abụọ. Asaya bụ onyeisi ha.
Kutoka uzao wa Merari, palikuwa na Asaia kiongozi na ndugu zake, wanaume 220.
7 Ụmụ Geshọm na ụmụnna ha dị otu narị na iri atọ. Juel bụ onyeisi ha.
Kutoka uzao wa Gerishomu, palikuwa na Yoeli kiongozi na ndugu zake, wanaume 130.
8 Ụmụ Elizafan na ụmụnna ha dị narị abụọ. Shemaya bụ onyeisi ha.
Kutoka uzao wa Elizafani, palikuwa na Shemaia kiongozi na ndugu zake, wanaume 200.
9 Ụmụ Hebrọn na ụmụnna ha dị iri asatọ. Eliel bụ onyeisi ha.
Kutoka uzao wa Hebroni, palikuwa na Elieli kiongozi na ndugu zake, wanaume themanini.
10 Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. Aminadab bụ onyeisi ha.
Kutoka uzao wa Uzieli, palikuwa na Aminadabu kiongozi na ndugu zake, wanaume 112.
11 Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha,
Daudi akaagiza Zadoki kuitwa na Abiathari kuhuani, na Walawi Urieli, Asaia, Yoeli, Shemaia, Elieli, na Aminadabu.
12 “Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.
Akasema, “Nyinyi ni viongozi wa familia za Kilawi. Jiwekeni wakfu, nyie na ndugu zenu, ilikwamba mlete sanduku la Yahweh, Mungu wa Israeli, kwenye sehemu niliyo iandaa.
13 Na mbụ, Onyenwe anyị Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.”
Mara ya kwanza hamkubeba. Ndio maana Yahweh Mungu wetu akawa na hasira kwetu, kwa kuwa hatuku mtafuta wala kutii amri yake.”
14 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.
Hivyo makuhani na Walawi waka jiweka wakfu iliwaweze kuleta sanduku la Yahweh, Mungu wa Israeli.
15 Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị.
Walawi wakabeba sanduku la Mungu katika mabega yao na nguzo, kama Musa alivyo amuru-kwa kufuata sheria zilizo tolewa na Yahweh.
16 Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
Daudi akazungumza na viongozi wa Walawi kuwapangia ndugu zao kuwa wana muziki wenye vyombo vya muziki, vyombo vya uzi, vinubi na upatu, kwa kupiga kwa sauti na furaha wakipaza sauti zao.
17 Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya,
Hivyo Walawi wakamchagua Hemani mwana wa Yoeli na mmoja wa kaka zake, Asafu mwana wa Berekia. Pia walimchagua ndugu wa uzao wa Merari na Ethani mwana wa Kushaia.
18 tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
Pamoja nao walikuwa ndugu wa daraja la pili: Zekarai, Yaazieli, Shemiramothi, Yehieli, Uni, Eliabu, Benaia, Maasaeia, Matithia, Elifelehu, Mikineaia, Obedi Edomu, na Yeieli, mlinzi wa lango.
19 Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz.
Wanamuziki Hemani, Asafu, na Ethani walichaguliwa kupiga upatu wa shaba.
20 Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị
Zekaria, Azieli, Shemiramothi, Yehieli, Uni Eliabu, Maaseia, na Benaia walicheza vyombo vya uzi.
21 Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.
Matithia, Elifelehu, Mikineia, Obedi Edomu, Yeieli, na Azazia waliongoza njia na vinubi.
22 Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
Kenania, kiongozi wa Walawi, aliongoza uimbaji sababu alikuwa mwalimu wa muziki.
23 Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.
Berekia na Elikana walikuwa walinzi wa sanduku.
24 Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
Shebania, Yoshafati, Nethanieli, Amasai, Zekaria, Benaia, na Eliezeri, makuhani, walikuwa wa kupuliza matarumbeta mbele ya sanduku la Mungu. Obedi Edomu na Yehia walikuwa walinzi wa sanduku.
25 Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.
Hivyo Daudi, wazee wa Israeli, na wakuu wa maelfu wakaenda kuchukua sanduku la agano la Yahweh kutoka nyumba ya Obedi Edomu kwa shangwe.
26 Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.
Wakati Mungu alipo wasaidia Walawi kubeba sanduku la agano la Yahweh, walitoa ng'ombe saba na mbuzi
27 Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.
Daudi alivishwa joho safi la maridadi, pamoja na Walawi walio beba sanduku, waimbaji, na Kenania, kiongozi wa nyimbo na waimbaji. Daudi alivaa juu ya joho lake naivera.
28 Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
Hivyo Israeli yote wakaleta sanduku la agano la Yahweh na kelele za shangwe, na sauti za tarumbeta, ngoma za saani, na vyombo vya uzi na vinubi.
29 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
Lakini sanduku la Yahweh lilivyokuja kwa mji wa Daudi, Mikali binti wa Sauli, alitazama nje ya dirisha, Akamuona Mfalme Daudi akicheza na kusherehekea. Kisha akamdharau moyoni mwake.

< 1 Ihe E Mere 15 >