< 1 Ihe E Mere 15 >

1 Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya.
Siden byggede han sig Huse i Davidsbyen og beredte Guds Ark et Sted, idet han rejste den et Telt.
2 Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na Onyenwe anyị họpụtara ha ibu igbe Onyenwe anyị na ije ozi nʼihu Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.”
Ved den Lejlighed sagde David: »Ingen andre end Leviterne maa bære Guds Ark, thi dem har HERREN udvalgt til at bære Guds Ark og til at gøre Tjeneste for ham til evig Tid.«
3 Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.
Og David samlede hele Israel i Jerusalem for at føre HERRENS Ark op til det Sted, han havde beredt den.
4 Ọ kpọkọtara ụmụ Erọn na ndị Livayị:
Og David samlede Arons Sønner og Leviterne:
5 Ndị Kohat na ụmụnna ha dị otu narị na iri abụọ. Uriel bụ onyeisi ha.
Af Kehatiterne Øversten Uriel og hans Brødre, 120;
6 Ụmụ Merari na ụmụnna ha dị narị abụọ na iri abụọ. Asaya bụ onyeisi ha.
af Merariterne Øversten Asaja og hans Brødre, 220;
7 Ụmụ Geshọm na ụmụnna ha dị otu narị na iri atọ. Juel bụ onyeisi ha.
af Gersoniterne Øversten Joel og hans Brødre, 130;
8 Ụmụ Elizafan na ụmụnna ha dị narị abụọ. Shemaya bụ onyeisi ha.
af Elizafans Sønner Øversten Sjemaja og hans Brødre, 200;
9 Ụmụ Hebrọn na ụmụnna ha dị iri asatọ. Eliel bụ onyeisi ha.
af Hebrons Sønner Øversten Eliel og hans Brødre, 80;
10 Ụmụ Uziel na ụmụnna ha dị otu narị na iri na abụọ. Aminadab bụ onyeisi ha.
af Uzziels Sønner Øversten Amminadab og hans Brødre, 112.
11 Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha,
Saa lod David Præsterne Zadok og Ebjatar og Leviterne Uriel, Asaja, Joel, Sjemaja, Eliel og Amminadab kalde
12 “Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel nʼebe a m doziri nʼihi ya.
og sagde til dem: »I er Overhoveder for Leviternes Fædrenehuse; helliger eder tillige med eders Brødre og før HERRENS, Israels Guds, Ark op til det Sted, jeg har beredt den;
13 Na mbụ, Onyenwe anyị Chineke tara anyị ahụhụ nʼihi na anyị esoghị omenaala ime ka unu bụ ndị Livayị buru ya. Anyị ajụtaghị ya ase otu a ga-esi bulata ya nʼụzọ o kwesiri.”
det var jo, fordi I ikke var med første Gang, at HERREN vor Gud tilføjede os et Brud; thi vi søgte ham ikke paa rette Maade.«
14 Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ.
Saa helligede Præsterne og Leviterne sig for at føre HERRENS, Israels Guds, Ark op;
15 Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị.
og Levis Sønner løftede med Bærestængerne Guds Ark op paa Skuldrene, som Moses havde paabudt efter HERRENS Ord.
16 Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
Fremdeles bød David Leviternes Øverster at lade deres Brødre Sangerne stille sig op med Musikinstrumenter, Harper, Citre og Cymbler og lade høje Jubeltoner klinge.
17 Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya,
Saa lod Leviterne Heman, Joels Søn, og af hans Brødre Asaf, Berekjas Søn, og af deres Brødre Merariterne Etan, Kusjajas Søn, stille sig op
18 tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
og ved Siden af dem deres Brødre af anden Rang Zekarja, Uzziel, Sjemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaja, Ma'aseja, Mattitja, Elipelehu og Miknejahu og Dørvogterne Obed-Edom og Je'iel;
19 Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz.
Sangerne Heman, Asaf og Etan skulde spille paa Kobbercymbler,
20 Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị
Zekarja, Uzziel, Sjemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Ma'aseja og Benaja paa Harper al-alamot;
21 Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.
Mattitja, Elipelehu, Miknejahu, Obed-Edom og Je'iel skulde lede Sangen med Citre al-hassjeminit;
22 Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
Konanja, Leviternes Øverste over dem, der bar, skulde lede disse, da han forstod sig derpaa;
23 Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị.
Berekja og Elkana skulde være Dørvogtere ved Arken;
24 Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
Præsterne Sjebanja, Josjafat, Netan'el, Amasaj, Zekarja, Benaja og Eliezer skulde blæse i Trompeterne foran Guds Ark; og Obed-Edom og Jehija skulde være Dørvogtere ved Arken.
25 Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ.
Derpaa drog David, Israels Ældste og Tusindførerne hen for under Festglæde at lade HERRENS Pagts Ark bringe op fra Obed-Edoms Hus,
26 Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja.
og da Gud hjalp Leviterne, der har HERRENS Pagts Ark, ofrede man syv Tyre og syv Vædre.
27 Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ.
David har en fin linned Kappe, ligeledes alle Leviterne, der har Arken, og Sangerne og Konanja, som ledede dem, der bar. Og David var iført en linned Efod.
28 Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
Og hele Israel bragte HERRENS Pagts Ark op under Festjubel og til Hornets, Trompeternes og Cymblernes Klang, under Harpe— og Citerspil.
29 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.
Men da HERRENS Pagts Ark kom til Davidsbyen, saa Sauls Datter Mikal ud af Vinduet, og da hun saa Kong David springe og danse, ringeagtede hun ham i sit Hjerte.

< 1 Ihe E Mere 15 >