< 1 Ihe E Mere 14 >

1 Hiram bụ eze Taịa zitere Devid ndị ozi, na ndị ọkwa ǹka osisi na ndị na-edo nkume, ka ha nyere Devid aka iwu ụlọeze ya. O nyekwara ya osisi sida o ji ewu ụlọ ahụ.
Tirski kralj Hiram posla k Davidu izaslanstvo i cedrovih drva, zidara i tesara da mu grade dvor.
2 Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel, na ebuliela alaeze ya elu nke ukwuu nʼihi ndị ya Izrel.
Tada David spozna da ga je Jahve potvrdio za kralja nad Izraelom i da je uzvisio njegovo kraljevstvo radi svojega izraelskog naroda.
3 Devid lụrụ ndị inyom ọzọ mgbe o jere biri na Jerusalem. Nke a mere ka ọ mụọ ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
David je uzeo još žena u Jeruzalemu i imao još sinova i kćeri.
4 Ndị a bụkwa aha ụmụ a mụụrụ ya nʼebe ahụ: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
Evo imena djece koja mu se rodiše u Jeruzalemu: Šamua, Šobab, Natan, Salomon,
5 Ibha, Elishua, Elpelet,
Jibhar, Elišua, Elpalet,
6 Noga, Nefeg, Jafia,
Nogah, Nefeg, Jafija,
7 Elishama, Beeliada na Elifelet.
Elišama, Beeljada i Elifelet.
8 Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel niile, ha pụrụ nʼigwe ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, jikere pụọ izute ha.
Kad su Filistejci čuli da su Davida pomazali za kralja nad svim Izraelom, iziđoše svi da se dočepaju Davida. David, čuvši to, iziđe pred njih.
9 Ma ndị Filistia bịara, bukọrọ ihe niile dị na Ndagwurugwu Refaim.
Filistejci dođoše i raširiše se po Refaimskoj dolini.
10 Devid jụrụ Chineke ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, aga m enyefe ha nʼaka gị.”
Tada David upita Boga: “Mogu li napasti Filistejce? Hoćeš li ih predati meni u ruke?” Jahve mu odgovori: “Napadni, jer ću ih predati tebi u ruke!”
11 Ya mere, Devid na ndị ikom ya gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Chineke enupula megide ndị iro m site nʼaka m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal Perazim.
Tada krenuše u Baal Perasim i David ih ondje pobi. David reče: “Bog je prodro među moje neprijatelje mojom rukom, kao što voda prodire.” Stoga se ono mjesto prozvalo Baal Perasim.
12 Ndị Filistia hapụrụ chi niile ha nʼebe ahụ, Devid nyere iwu ka e suo ha niile ọkụ.
Ostavili su ondje svoje bogove; a David zapovjedi da ih spale.
13 Ndị Filistia bukwara agha bịa na ndagwurugwu ahụ ọzọ.
Opet se Filistejci raširiše po onoj dolini.
14 Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
David opet upita Boga, a Bog mu odgovori: “Ne idi za njima nego ih opkoli i navali na njih s protivne strane Bekaima.
15 Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
Pa kad začuješ topot koraka po bekaimskim vrhovima, onda izađi u boj, jer će tada ići Bog pred tobom da pobije filistejsku vojsku.”
16 Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.
David učini kako mu je zapovjedio Bog; i pobili su filistejsku vojsku od Gibeona do Gezera.
17 Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.
Davidovo se ime pročulo po svim zemljama, a Jahve uli strah od njega svim narodima.

< 1 Ihe E Mere 14 >