< 1 Ihe E Mere 12 >

1 Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha.
Waɗannan su ne mutanen da suka zo wurin Dawuda a Ziklag, yayinda aka kore shi daga gaban Shawulu ɗan Kish (suna cikin jarumawan da suka taimake shi a yaƙi;
2 Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.)
suna da baka suna kuma iya harba kibiya, ko majajjawa da hannun dama ko na hagu; su’yan’uwan Shawulu ne daga kabilar Benyamin):
3 Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea. Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet, Beraka, Jehu onye Anatot,
Ahiyezer babbansu da Yowash’ya’yan Shema’a maza daga Gibeya; Yeziyel da Felet’ya’yan Azmawet; Beraka, Yehu daga Anatot,
4 Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ, Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera,
da Ishmahiya daga Gibeyon, wani jarumi a cikin Talatin nan, wanda shi ne shugaban Talatin; Irmiya, Yahaziyel, Yohanan, Yozabad daga Gedera,
5 Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf;
Eluzai, Yerimot, Beyaliya, Shemariya da Shefatiya daga Haruf;
6 Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora;
Elkana, Isshiya, Azarel, Yoyezer da Yashobeyam daga Kora;
7 Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa.
da Yoyela da Zebadiya’ya’yan Yeroham maza daga Gedor.
8 Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm.
Sai waɗansu mutanen Gad suka koma suna goyon bayan Dawuda suka kuma haɗa kai da shi a kagararsa a hamada. Su ƙwararrun mayaƙa ne, a shirye don yaƙi, kuma suna iya riƙe garkuwa da māshi. Fuskokinsu kamar fuskoki zakoki, kuma suna da sauri kamar bareyi a kan duwatsu.
9 Eza, bụ onyeisi ha. Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro.
Ezer shi ne babba, Obadiya shi ne mai binsa a shugabanci, Eliyab na uku,
10 Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya,
Mismanna na huɗu, Irmiya na biyar,
11 na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa,
Attai na shida, Eliyel na bakwai,
12 na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu,
Yohanan na takwas, Elzabad na tara,
13 na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu.
Irmiya na goma da kuma Makbannai na goma sha ɗaya.
14 Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.
Waɗannan mutanen Gad shugabannin mayaƙa ne; ƙarami a cikinsu zai iya ƙara da mutum ɗari, kuma babba a cikin zai iya ƙara da dubu.
15 Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
Su ne suka haye Urdun a wata na farko sa’ad da kogin ya yi ambaliya, suka kuma kori duk mai rai a kwarin, na wajen gabas da na wajen yamma.
16 Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.
Sauran mutanen Benyamin da waɗansu mutanen Yahuda su ma suka zo wurin Dawuda a kagararsa.
17 Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”
Sai Dawuda ya fita don yă tarye su, ya kuma ce musu, “In kun zo wurina da salama, don ku taimake ni, to, ina a shirye in bar ku ku haɗa kai tare da ni. Amma in kun zo don ku bashe ni ga abokan gābana sa’ad da hannuwana ba su da laifi a rikici, bari Allah na kakanninmu yă duba yă kuma shari’anta ku.”
18 Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.
Sai Ruhu ya sauko a kan Amasai, shugaban Talatin nan, sai ya ce, “Mu naka ne, ya Dawuda! Muna tare da kai, ya ɗan Yesse! Nasara, nasara gare ka, nasara kuma ga waɗanda suke taimakonka. Gama Allahnka zai taimake ka.” Saboda haka Dawuda ya karɓe su ya kuma mai da su shugabannin ƙungiyoyin maharansa.
19 Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”
Waɗansu mutanen Manasse suka haɗa kai da Dawuda sa’ad da ya tafi tare da Filistiyawa don yă yaƙi Shawulu (Shi da mutanensa ba su taimaki Filistiyawa ba domin bayan shawarwari, shugabanninsu suka salame shi. Sun ce, “Za mu biya da kawunanmu in ya koma ga maigidansa Shawulu.”)
20 Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.
Da Dawuda ya tafi Ziklag, waɗannan mutanen Manasse ne suka haɗa kai da shi. Adna, Yozabad, Yediyayel, Mika’ilu, Yozabad, Elihu da Zilletai, shugabannin ƙungiyoyi na dubu a cikin Manasse.
21 Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.
Suka taimaki Dawuda a kan ƙungiyoyin hari, gama dukansu jarumawa ne sosai, kuma su shugabanni ne a cikin mayaƙansa.
22 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.
Kowace rana mutane suka riƙa zuwa don su taimaki Dawuda, sai da ya kasance da runduna mai girma, kamar mayaƙan Allah.
23 Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.
Ga yawan mutanen shiryayyu don yaƙi waɗanda suka zo wurin Dawuda a Hebron don su mai da mulkin Shawulu gare shi, yadda Ubangiji ya faɗa.
24 Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ.
Mutanen Yahuda, masu riƙe garkuwa da māshi, su 6,800 shiryayyu don yaƙi;
25 Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị.
mutanen Simeyon, jarumawa shiryayyu don yaƙi, su 7,100;
26 Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii.,
mutanen Lawi, su 4,600,
27 tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa,
haɗe da Yehohiyada, shugaban iyalin Haruna tare da mutane 3,700,
28 na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ ndị si nʼezinaụlọ ya.
da Zadok, matashi jarumi sosai, tare da shugabanni su 22 daga iyalinsa;
29 Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ, nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl.
mutanen Benyamin,’yan’uwan Shawulu, su 3,000, yawanci waɗanda suke biyayya ga gidan Shawulu sai lokacin;
30 Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ, ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.
mutanen Efraim, jarumawa, sanannu cikin gidajensu, su 20 800;
31 Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze.
mutanen rabin kabilar Manasse, sanannu da sunaye suka zo suka mai da Dawuda sarki, su 18,000;
32 Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ, na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.
mutanen Issakar, masu fahimtar lokuta suka kuma san abin da ya kamata Isra’ila ya yi, manya 200, tare da danginsu a ƙarƙashin shugabancinsu;
33 Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.
mutanen Zebulun, ƙwararru sojoji shiryayyu don yaƙi da kowane irin makami, suka zo don su taimaki Dawuda da zuciya ɗaya, su 50,000;
34 Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku, tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa, ndị ji ùbe na ọta.
mutanen Naftali su 1,000 shugabanni, tare da mutane 37,000 masu riƙe garkuwa da masu;
35 Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha.
mutanen Dan, shiryayyu don yaƙi, su 28,600;
36 Ụmụ Asha dị iri puku anọ. Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya.
mutanen Asher, ƙwararrun sojoji shiryayyu don yaƙi, su 40,000;
37 Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ, ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta.
kuma daga gabashin Urdun, mutanen Ruben, Gad da kuma rabin kabilar Manasse, masu kayan yaƙi iri-iri, su 120,000.
38 Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.
Dukan waɗannan mayaƙa ne waɗanda suka ba da kansu da yardar rai su yi hidima. Suka zo Hebron da cikakken niyya don su naɗa Dawuda sarki a bisa dukan Isra’ila. Duka sauran Isra’ilawa su ma suka goyi baya a naɗa Dawuda sarki.
39 Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
Mutanen suka yi kwana uku a can tare da Dawuda, suna ci suna sha, gama iyalansu sun yi musu tanadi.
40 Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.
Haka ma, maƙwabtansu daga nesa har Issakar, Zebulun da Naftali suka zo suka kawo abinci a kan jakuna, raƙuma, alfadarai da shanu. Akwai tanadin mai yawa na gari, kauɗar ɓaure, nonnan busassun’ya’yan inabi, ruwan inabi, mai, shanu da tumaki. Duk an yi haka don a nuna farin ciki ƙwarai a cikin dukan ƙasar Isra’ila.

< 1 Ihe E Mere 12 >