< 1 Ihe E Mere 12 >

1 Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha.
And these [are] those coming in unto David to Ziklag, while shut up because of Saul son of Kish, and they [are] among the mighty ones, helping the battle,
2 Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.)
armed with bow, right and left handed, with stones, and with arrows, with bows, of the brethren of Saul, of Benjamin.
3 Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea. Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet, Beraka, Jehu onye Anatot,
The head [is] Ahiezer, and Joash, sons of Shemaab the Gibeathite, and Jeziel, and Pelet, sons of Azmaveth, and Berachah, and Jehu the Antothite,
4 Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ, Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera,
and Ishmaiah the Gibeonite, a mighty one among the thirty, and over the thirty, and Jeremiah, and Jahaziel, and Johanan, and Josabad the Gederathite.
5 Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf;
Eluzai, and Jerimoth, and Bealiah, and Shemariah, and Shephatiah the Haruphite;
6 Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora;
Elkanah, and Jesiah, and Azareel, and Joezer, and Jashobeam the Korhites,
7 Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa.
and Joelah, and Zebadiah, sons of Jeroham of Gedor.
8 Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm.
And of the Gadite there have been separated unto David, to the fortress, to the wilderness, mighty of valour, men of the host for battle, setting in array target and buckler, and their faces the face of the lion, and as roes on the mountains for speed:
9 Eza, bụ onyeisi ha. Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro.
Ezer the head, Obadiah the second, Eliab the third,
10 Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya,
Mishmannah the fourth, Jeremiah the fifth,
11 na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa,
Attai the sixth, Eliel the seventh,
12 na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu,
Johanan the eighth, Elzabad the ninth,
13 na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu.
Jeremiah the tenth, Machbannai the eleventh.
14 Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.
These [are] of the sons of Gad, heads of the host, one of a hundred [is] the least, and the greatest, of a thousand;
15 Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
these [are] they who have passed over the Jordan in the first month, — and it is full over all its banks — and cause all [they of] the valley to flee to the east and to the west.
16 Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.
And there come of the sons of Benjamin and Judah unto the stronghold to David,
17 Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”
and David goeth out before them, and answereth and saith to them, 'If for peace ye have come in unto me, to help me, I have a heart to unite with you; and if to betray me to mine adversaries — without violence in my hands — the God of our fathers doth see and reprove.'
18 Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.
And the Spirit hath clothed Amasai, head of the captains: 'To thee, O David, and with thee, O son of Jesse — peace! peace to thee, and peace to thy helper, for thy God hath helped thee;' and David receiveth them, and putteth them among the heads of the troop.
19 Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”
And of Manasseh there have fallen unto David in his coming with the Philistines against Israel to battle — and they helped them not, for by counsel the princes of the Philistines sent him away, saying, 'With our heads he doth fall unto his master Saul.' —
20 Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.
In his going unto Ziglag there have fallen unto him of Manasseh, Adnah, and Jozabad, and Jediael, and Michael, and Jozabad, and Elihu, and Zillthai, heads of the thousands that [are] of Manasseh;
21 Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.
and they have helped with David over the troop, for mighty of valour [are] all of them, and they are captains in the host,
22 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.
for at that time, day by day, they come in unto David to help him, till it is a great camp, like a camp of God.
23 Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.
And these [are] the numbers of the head, of the armed men of the host; they have come in unto David to Hebron to turn round the kingdom of Saul unto him, according to the mouth of Jehovah.
24 Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ.
The sons of Judah, bearing target and spear, [are] six thousand and eight hundred, armed ones of the host.
25 Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị.
Of the sons of Simeon, mighty ones of valour for the host, [are] seven thousand and a hundred.
26 Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii.,
Of the sons of Levi [are] four thousand and six hundred;
27 tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa,
and Jehoiada [is] the leader of the Aaronite, and with him [are] three thousand and seven hundred,
28 na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ ndị si nʼezinaụlọ ya.
and Zadok, a young man, mighty of valour, and of the house of his father [are] twenty and two heads.
29 Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ, nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl.
And of the sons of Benjamin, brethren of Saul, [are] three thousand, and hitherto their greater part are keeping the charge of the house of Saul.
30 Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ, ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.
And of the sons of Ephraim [are] twenty thousand and eight hundred, mighty of valour, men of name, according to the house of their fathers.
31 Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze.
And of the half of the tribe of Manasseh [are] eighteen thousand, who have been defined by name, to come in to cause David to reign.
32 Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ, na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.
And of the sons of Issachar, having understanding for the times, to know what Israel should do; their heads [are] two hundred, and all their brethren [are] at their command.
33 Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.
Of Zebulun, going forth to the host, arranging battle with all instruments of battle, [are] fifty thousand, and keeping rank without a double heart.
34 Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku, tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa, ndị ji ùbe na ọta.
And of Naphtali, a thousand heads, and with them, with target and spear, [are] thirty and seven thousand.
35 Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha.
And of the Danite, arranging battle, [are] twenty and eight thousand and six hundred.
36 Ụmụ Asha dị iri puku anọ. Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya.
And of Asher, going forth to the host, to arrange battle, [are] forty thousand.
37 Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ, ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta.
And from beyond the Jordan, of the Reubenite, and of the Gadite, and of the half of the tribe of Manasseh, with all instruments of the host for battle, [are] a hundred and twenty thousand.
38 Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.
All these [are] men of war, keeping rank — with a perfect heart they have come to Hebron, to cause David to reign over all Israel, and also all the rest of Israel [are] of one heart, to cause David to reign,
39 Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
and they are there, with David, three days, eating and drinking, for their brethren have prepared for them.
40 Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.
And also those near unto them, unto Issachar, and Zebulun, and Naphtali, are bringing in bread on asses, and on camels, and on mules, and on oxen — food of fine flour, fig-cakes and grape-cakes, and wine, and oil, and oxen, and sheep, in abundance, for joy [is] in Israel.

< 1 Ihe E Mere 12 >