< 1 Ihe E Mere 11 >

1 Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
And all Israel assembled themselves to David to Hebron, saying, Behold, we are thy bone and thy flesh.
2 Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’”
Even aforetime, even when Saul was king, thou wast he that leddest out and broughtest in Israel; and Jehovah thy God said to thee, Thou shalt feed my people Israel, and thou shalt be prince over my people Israel.
3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
And all the elders of Israel came to the king to Hebron; and David made a covenant with them in Hebron before Jehovah; and they anointed David king over Israel according to the word of Jehovah through Samuel.
4 Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ,
And David and all Israel went to Jerusalem, which is Jebus; where the Jebusites were, the inhabitants of the land.
5 gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
And the inhabitants of Jebus said to David, Thou shalt not come in hither. But David took the stronghold of Zion, which is the city of David.
6 Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
And David said, Whoever smites the Jebusites first shall be chief and captain. And Joab the son of Zeruiah went first up, and was chief.
7 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid.
And David dwelt in the stronghold; therefore they called it the city of David.
8 O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ.
And he built the city round about, even from the Millo round about; and Joab renewed the rest of the city.
9 Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya.
And David became continually greater; and Jehovah of hosts was with him.
10 Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa.
And these are the chief of the mighty men whom David had, who shewed themselves valiant with him in his kingdom, with all Israel, to make him king, according to the word of Jehovah concerning Israel.
11 Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere: Jashobeam, onye Hakmon, bụ onyeisi nʼetiti ndịisi ndị ọzọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
And this is the number of the mighty men whom David had: Jashobeam, the son of Hachmoni, the chief of the captains; he brandished his spear against three hundred, slain [by him] at one time.
12 Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ.
And after him, Eleazar the son of Dodo, the Ahohite; he was one of the three mighty men.
13 Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia.
He was with David at Pas-dammim, where the Philistines were gathered together to battle; and there was [there] a plot of ground full of barley; and the people had fled from before the Philistines.
14 Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
And they stood in the midst of the plot and delivered it, and smote the Philistines; and Jehovah wrought a great deliverance.
15 Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
And three of the thirty chiefs went down to the rock to David, to the cave of Adullam, when the army of the Philistines was encamped in the valley of Rephaim.
16 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem.
And David was then in the stronghold; and the Philistines' garrison was then at Bethlehem.
17 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
And David longed, and said, Oh that one would give me to drink of the water of the well of Bethlehem, which is in the gate!
18 Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị,
And the three broke through the camp of the Philistines, and drew water out of the well of Bethlehem, which is in the gate, and took it, and brought it to David; David however would not drink of it, but poured it out to Jehovah.
19 “Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
And he said, My God forbid it me, that I should do this thing! should I drink the blood of these men [who went] at the risk of their lives? for at the risk of their lives they brought it. Therefore he would not drink it. These things did the three mighty men.
20 Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
And Abishai the brother of Joab, he was the chief of three; and he brandished his spear against three hundred and slew them; and he had a name among the three.
21 Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
Of the three he was more honourable than the two, and he was their captain; but he did not attain to the [first] three.
22 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
Benaiah the son of Jehoiada, the son of a valiant man, great in exploits, of Kabzeel: he it was that smote two lions of Moab; and he went down and smote a lion in the midst of a pit on a snowy day.
23 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya.
He also smote the Egyptian, a man of stature, five cubits high: and in the Egyptian's hand was a spear like a weaver's beam; and he went down to him with a staff, and plucked the spear out of the Egyptian's hand, and slew him with his own spear.
24 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ.
These things did Benaiah the son of Jehoiada, and he had a name among the three mighty men.
25 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
Behold, he was honoured above the thirty, but he did not attain to the [first] three. And David set him in his council.
26 Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a: Asahel nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo onye Betlehem,
And the valiant men of the forces were: Asahel the brother of Joab, Elhanan the son of Dodo of Bethlehem,
27 Shamot onye Haroa, Helez onye Pelon,
Shammoth the Harorite, Helez the Pelonite,
28 Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza onye Anatot,
Ira the son of Ikkesh the Tekoite, Abiezer the Anathothite,
29 Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahohi,
Sibbechai the Hushathite, Ilai the Ahohite,
30 Maharai onye Netofa, Heled nwa Baana, onye Netofa,
Maharai the Netophathite, Heled the son of Baanah the Netophathite,
31 Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya onye Piraton,
Ittai the son of Ribai of Gibeah of the children of Benjamin, Benaiah the Pirathonite,
32 Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abiel onye Arba,
Hurai of the brooks of Gaash, Abiel the Arbathite,
33 Azmavet onye Baharum, Eliaba onye Shaalbon,
Azmaveth the Baharumite, Eliahba the Shaalbonite,
34 Ụmụ Hashem onye Gizon, Jonatan nwa Shagee, onye Hara,
Bene-Hashem the Gizonite, Jonathan the son of Shage the Hararite,
35 Ahiam nwa Saka, onye Hara, Elifal nwa Ụọ,
Ahiam the son of Sacar the Hararite, Eliphal the son of Ur,
36 Hefa onye Mekerat, Ahija onye Pelon,
Hepher the Mecherathite, Ahijah the Pelonite,
37 Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai,
Hezro the Carmelite, Naarai the son of Ezbai,
38 Juel nwanne Netan, Miba nwa Hagri,
Joel the brother of Nathan, Mibhar the son of Hagri,
39 Zelek onye Amọn, Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya,
Zelek the Ammonite, Naharai the Berothite, the armour-bearer of Joab the son of Zeruiah,
40 Ira onye Itra, Gareb onye Itra,
Ira the Ithrite, Gareb the Ithrite,
41 Ụraya onye Het, Zabad nwa Alai,
Uriah the Hittite, Zabad the son of Ahlai,
42 Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya.
Adina the son of Shiza the Reubenite, a captain of the Reubenites, and thirty with him;
43 Hanan nwa Maaka, Joshafat onye Mitna,
Hanan the son of Maachah, and Joshaphat the Mithnite,
44 Ụzia onye Ashterat, Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea,
Uzzia the Ashtarothite, Shama and Jeiel the sons of Hotham the Aroerite,
45 Jediael nwa Shimri, Joha nwanne ya, onye Tiza,
Jediael the son of Shimri, and Joha his brother, the Tizite,
46 Eliel onye Mahavi, Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam, Itma onye Moab,
Eliel of Mahavim, and Jeribai, and Joshaviah, the sons of Elnaam, and Jithmah the Moabite,
47 Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.
Eliel, and Obed, and Jaasiel the Mezobaite.

< 1 Ihe E Mere 11 >