< Birák 1 >

1 Volt Józsua halála után, megkérdezték Izraél fiai az Örökkévalót, mondván: Ki vonuljon közülünk először a kanaáni ellen, hogy harczoljon vele?
Mgbe Joshua nwụrụ, ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị sị, “Olee ebo ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha nʼihi anyị?”
2 Mondta az Örökkévaló: Jehúda vonuljon; íme kezébe adtam az országot.
Onyenwe anyị zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.”
3 S mondta Jehúda Simeónnak, az ő testvérének: Vonulj velem sorsomba, hadd harczoljunk a kanaánival, akkor megyek majd én is te veled sorsodba. És ment vele Simeón.
Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa.
4 Fölvonult Jehúda, és kezükbe adta az Örökkévaló a kanaánit és a perizzit; és megverték őket Bézekben – tízezer embert.
Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek.
5 Ott találták Adóni-Bézeket Bézekben és harczoltak ellene; és megverték a kanaánit és a perizzit.
Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz.
6 És megfutamodott Adóni-Bézek, és üldözték őt; megfogták őt és levágták kezeinek és lábainak hüvelykujjait.
Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.
7 Akkor mondta Adóni-Bézek: Hetven király – kezük és lábuk hüvelykujja levágva – szedegettek asztalom alatt; a hogy én tettem, úgy fizetett nekem Isten. És bevitték őt Jeruzsálembe, és meghalt ott.
Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.
8 Akkor harczoltak Jehúda fiai Jeruzsálem ellen, bevették azt és megverték a kard élével; a várost pedig tűzbe borították.
Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.
9 Azután lementek Jehúda fiai harczolni a kanaánival a hegység, a Délvidék és az alföld lakójával.
Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala.
10 Ment Jehúda a kánaáni ellen, ki Chebrónban lakott – Chebrón neve pedig azelőtt Kirjat-Arbá volt – és megverték Sésájt, Achímánt és Talmájt.
Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai.
11 Onnan ment Debír lakói ellen; Debír neve pedig azelőtt Kirját-Széfer volt.
Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).
12 És mondta Káléb: A ki megveri Kirját-Széfert és beveszi, annak oda adom leányomat, Akhszát, nőül.
Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
13 És bevette Otniél, Kenáz fia, Káléb fiatalabb testvére; és oda adta neki leányát, Akhszát, nőül.
Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
14 S történt, mikor odajött, rábeszélte, hogy kérjen atyjától mezőt; és lesiklott a szamárról. És mondta neki Káléb: Mi lelt?
Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
15 Mondta neki: Adj nekem áldást, mert a délvidéki földre adtál engem, adjál hát nekem vízkútfőket. Erre adta neki Káléb a felső kútfőket és az alsó kútfőket.
Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
16 A kénitának, Mózes ipjának fiai pedig fölmentek a pálmák városából Jehúda fiaival együtt Jehúda pusztájába, mely Arádtól délre van; mentek és maradtak a néppel.
Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad.
17 S ment Jehúda Simeónnal, az ő testvérével, és megverték a kanaánit, Czefát lakóját, elpusztították és elnevezték a várost Chormának.
Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa.
18 És bevette Jehúda Azzát és határát, Askelónt és határát, meg Ekrónt és határát.
Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu.
19 És volt az Örökkévaló Jehúdával, és elfoglalta a hegységet, mert nem bírta kiűzni a völgy lakóit, mert vasszekerük volt nekik.
Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche.
20 És adták Kálébnek Chebrónt, a mint mondta volt Mózes; és kiűzte onnan Anák három fiát.
E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.
21 A jebúszit pedig, Jeruzsálem lakóját, nem űzték ki Benjámin fiai; így maradt a jebúszi Benjámin fiaival Jeruzsálemben mind e mai napig.
Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.
22 Vonultak a József házabeliek, ők is, Bét-Élbe és az Örökkévaló velük volt.
Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.
23 Kikémleltették a József házabeliek Bét-Élt; a városnak neve pedig azelőtt Lúz volt.
Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,
24 És láttak az őrök egy embert kijönni a városból, és mondták neki: Mutasd meg nekünk, kérlek, a város bejáratát és mi majd szeretetet cselekszünk veled.
ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”
25 Megmutatta nekik a város bejáratát, és megverték a várost a kard élével; az embert pedig és egész családját elbocsátották.
Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ.
26 S elment az ember a chittiták földjére, épített várost és elnevezte Lúznak; ez a neve mind e mai napig.
Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.
27 Nem űzte ki Menasse Bét-Seánt és leányvárosait, Táanákhot és leányvárosait, meg Dór lakóit és leányvárosait, Jibleám lakóit és leányvárosait, sem Meggidó lakóit és leányvárosait; és belenyugodott a kanaáni, hogy maradjon ebben az országban.
Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ.
28 Történt pedig, mikor megerősödött Izraél, alattvalóvá tette a kanaánit, de kiűzni nem űzte ki.
Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ.
29 Efraim nem űzte ki a kanaánit, ki Gézerben lakott; így maradt közte a kanaáni Gézerben.
Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ.
30 Zebúlún nem űzte ki Kitrón lakóit, sem Náhalól lakóit; így maradt közte a kanaáni, és alattvalókká lettek.
Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike.
31 Ásér nem űzte ki Akkó lakóit, sem Czídón lakóit, meg Achlábot, Akhzíbot, Chelbát, Afíkot és Rechóbot.
Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob.
32 Így lakott az Áséri a kanaáni, az ország lakói között, mert nem űzte ki.
Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha.
33 Naftáli nem űzte ki Bét-Sémes lakóit, sem Bét-Anát lakóit, és így lakott ő a kanaáni, az ország lakói közt; Bét-Sémes és Bét-Anát lakói pedig lettek nekik alattvalóikká.
Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị.
34 És szorította az emóri Dán fiait a hegységbe, mert nem engedte leszállni a völgybe.
Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.
35 S belenyugodott az emóri, hogy lakjon Chéresz hegyén, Ajjálónban és Sáalebímban; de nehéz lett József házának keze, és alattvalókká lettek.
Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha.
36 Az emóri határa pedig Akrabbím hágójától, a Sziklán felül.
Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.

< Birák 1 >