< תהילים 84 >

למנצח על הגתית לבני קרח מזמור מה ידידות משכנותיך יהוה צבאות׃ 1
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile!
נכספה וגם כלתה נפשי לחצרות יהוה לבי ובשרי ירננו אל אל חי׃ 2
Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige Onyenwe anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ Chineke dị ndụ.
גם צפור מצאה בית ודרור קן לה אשר שתה אפרחיה את מזבחותיך יהוה צבאות מלכי ואלהי׃ 3
Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m.
אשרי יושבי ביתך עוד יהללוך סלה׃ 4
Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. (Sela)
אשרי אדם עוז לו בך מסלות בלבבם׃ 5
Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.
עברי בעמק הבכא מעין ישיתוהו גם ברכות יעטה מורה׃ 6
Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.
ילכו מחיל אל חיל יראה אל אלהים בציון׃ 7
Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn.
יהוה אלהים צבאות שמעה תפלתי האזינה אלהי יעקב סלה׃ 8
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb.
מגננו ראה אלהים והבט פני משיחך׃ 9
Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya.
כי טוב יום בחצריך מאלף בחרתי הסתופף בבית אלהי מדור באהלי רשע׃ 10
Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume.
כי שמש ומגן יהוה אלהים חן וכבוד יתן יהוה לא ימנע טוב להלכים בתמים׃ 11
Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.
יהוה צבאות אשרי אדם בטח בך׃ 12
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.

< תהילים 84 >