< תהילים 83 >

שיר מזמור לאסף אלהים אל דמי לך אל תחרש ואל תשקט אל׃ 1
Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ.
כי הנה אויביך יהמיון ומשנאיך נשאו ראש׃ 2
Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha.
על עמך יערימו סוד ויתיעצו על צפוניך׃ 3
Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya.
אמרו לכו ונכחידם מגוי ולא יזכר שם ישראל עוד׃ 4
Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”
כי נועצו לב יחדו עליך ברית יכרתו׃ 5
Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,
אהלי אדום וישמעאלים מואב והגרים׃ 6
ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga,
גבל ועמון ועמלק פלשת עם ישבי צור׃ 7
na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa.
גם אשור נלוה עמם היו זרוע לבני לוט סלה׃ 8
Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. (Sela)
עשה להם כמדין כסיסרא כיבין בנחל קישון׃ 9
Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn,
נשמדו בעין דאר היו דמן לאדמה׃ 10
ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala.
שיתמו נדיבמו כערב וכזאב וכזבח וכצלמנע כל נסיכמו׃ 11
Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna,
אשר אמרו נירשה לנו את נאות אלהים׃ 12
ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.”
אלהי שיתמו כגלגל כקש לפני רוח׃ 13
O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị.
כאש תבער יער וכלהבה תלהט הרים׃ 14
Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,
כן תרדפם בסערך ובסופתך תבהלם׃ 15
si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri.
מלא פניהם קלון ויבקשו שמך יהוה׃ 16
Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị.
יבשו ויבהלו עדי עד ויחפרו ויאבדו׃ 17
Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala.
וידעו כי אתה שמך יהוה לבדך עליון על כל הארץ׃ 18
Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.

< תהילים 83 >