< תהילים 70 >

למנצח לדוד להזכיר אלהים להצילני יהוה לעזרתי חושה׃ 1
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ. O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m, O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.
יבשו ויחפרו מבקשי נפשי יסגו אחור ויכלמו חפצי רעתי׃ 2
Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara. Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m laghachi azụ nʼihere.
ישובו על עקב בשתם האמרים האח האח׃ 3
Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” laghachi azụ nʼihi ihere ha.
ישישו וישמחו בך כל מבקשיך ויאמרו תמיד יגדל אלהים אהבי ישועתך׃ 4
Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị, ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.”
ואני עני ואביון אלהים חושה לי עזרי ומפלטי אתה יהוה אל תאחר׃ 5
Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa; O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.

< תהילים 70 >