< תהילים 29 >
מזמור לדוד הבו ליהוה בני אלים הבו ליהוה כבוד ועז׃ | 1 |
Abụ Ọma Devid. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
הבו ליהוה כבוד שמו השתחוו ליהוה בהדרת קדש׃ | 2 |
Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
קול יהוה על המים אל הכבוד הרעים יהוה על מים רבים׃ | 3 |
Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe nʼelu oke osimiri.
קול יהוה בכח קול יהוה בהדר׃ | 4 |
Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
קול יהוה שבר ארזים וישבר יהוה את ארזי הלבנון׃ | 5 |
Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
וירקידם כמו עגל לבנון ושרין כמו בן ראמים׃ | 6 |
Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn wulie elu dịka nwa atụ.
Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu.
קול יהוה יחיל מדבר יחיל יהוה מדבר קדש׃ | 8 |
Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
קול יהוה יחולל אילות ויחשף יערות ובהיכלו כלו אמר כבוד׃ | 9 |
Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
יהוה למבול ישב וישב יהוה מלך לעולם׃ | 10 |
Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
יהוה עז לעמו יתן יהוה יברך את עמו בשלום׃ | 11 |
Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.