< תהילים 18 >

למנצח לעבד יהוה לדוד אשר דבר ליהוה את דברי השירה הזאת ביום הציל יהוה אותו מכף כל איביו ומיד שאול ויאמר ארחמך יהוה חזקי׃ 1
Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị: O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.
יהוה סלעי ומצודתי ומפלטי אלי צורי אחסה בו מגני וקרן ישעי משגבי׃ 2
Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m. Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.
מהלל אקרא יהוה ומן איבי אושע׃ 3
Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto, ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
אפפוני חבלי מות ונחלי בליעל יבעתוני׃ 4
Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ; ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
חבלי שאול סבבוני קדמוני מוקשי מות׃ (Sheol h7585) 5
Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
בצר לי אקרא יהוה ואל אלהי אשוע ישמע מהיכלו קולי ושועתי לפניו תבוא באזניו׃ 6
Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị; etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka; akwa m rutekwara ya ntị, o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
ותגעש ותרעש הארץ ומוסדי הרים ירגזו ויתגעשו כי חרה לו׃ 7
Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
עלה עשן באפו ואש מפיו תאכל גחלים בערו ממנו׃ 8
Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
ויט שמים וירד וערפל תחת רגליו׃ 9
O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
וירכב על כרוב ויעף וידא על כנפי רוח׃ 10
Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
ישת חשך סתרו סביבותיו סכתו חשכת מים עבי שחקים׃ 11
O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
מנגה נגדו עביו עברו ברד וגחלי אש׃ 12
Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.
וירעם בשמים יהוה ועליון יתן קלו ברד וגחלי אש׃ 13
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
וישלח חציו ויפיצם וברקים רב ויהמם׃ 14
Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
ויראו אפיקי מים ויגלו מוסדות תבל מגערתך יהוה מנשמת רוח אפך׃ 15
E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị, na nkuume si gị nʼimi pụta.
ישלח ממרום יקחני ימשני ממים רבים׃ 16
O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
יצילני מאיבי עז ומשנאי כי אמצו ממני׃ 17
Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
יקדמוני ביום אידי ויהי יהוה למשען לי׃ 18
Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
ויוציאני למרחב יחלצני כי חפץ בי׃ 19
Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
יגמלני יהוה כצדקי כבר ידי ישיב לי׃ 20
Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
כי שמרתי דרכי יהוה ולא רשעתי מאלהי׃ 21
Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
כי כל משפטיו לנגדי וחקתיו לא אסיר מני׃ 22
Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
ואהי תמים עמו ואשתמר מעוני׃ 23
Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
וישב יהוה לי כצדקי כבר ידי לנגד עיניו׃ 24
Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.
עם חסיד תתחסד עם גבר תמים תתמם׃ 25
Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
עם נבר תתברר ועם עקש תתפתל׃ 26
Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
כי אתה עם עני תושיע ועינים רמות תשפיל׃ 27
Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.
כי אתה תאיר נרי יהוה אלהי יגיה חשכי׃ 28
Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
כי בך ארץ גדוד ובאלהי אדלג שור׃ 29
Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
האל תמים דרכו אמרת יהוה צרופה מגן הוא לכל החסים בו׃ 30
Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
כי מי אלוה מבלעדי יהוה ומי צור זולתי אלהינו׃ 31
Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?
האל המאזרני חיל ויתן תמים דרכי׃ 32
Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
משוה רגלי כאילות ועל במתי יעמידני׃ 33
Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
מלמד ידי למלחמה ונחתה קשת נחושה זרועתי׃ 34
Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
ותתן לי מגן ישעך וימינך תסעדני וענותך תרבני׃ 35
Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
תרחיב צעדי תחתי ולא מעדו קרסלי׃ 36
Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
ארדוף אויבי ואשיגם ולא אשוב עד כלותם׃ 37
Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
אמחצם ולא יכלו קום יפלו תחת רגלי׃ 38
Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.
ותאזרני חיל למלחמה תכריע קמי תחתי׃ 39
Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
ואיבי נתתה לי ערף ומשנאי אצמיתם׃ 40
I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.
ישועו ואין מושיע על יהוה ולא ענם׃ 41
Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
ואשחקם כעפר על פני רוח כטיט חוצות אריקם׃ 42
Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
תפלטני מריבי עם תשימני לראש גוים עם לא ידעתי יעבדוני׃ 43
Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
לשמע אזן ישמעו לי בני נכר יכחשו לי׃ 44
Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
בני נכר יבלו ויחרגו ממסגרותיהם׃ 45
Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
חי יהוה וברוך צורי וירום אלוהי ישעי׃ 46
Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.
האל הנותן נקמות לי וידבר עמים תחתי׃ 47
Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,
מפלטי מאיבי אף מן קמי תרוממני מאיש חמס תצילני׃ 48
onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
על כן אודך בגוים יהוה ולשמך אזמרה׃ 49
Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto.
מגדל ישועות מלכו ועשה חסד למשיחו לדוד ולזרעו עד עולם׃ 50
Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

< תהילים 18 >