< תהילים 129 >
שיר המעלות רבת צררוני מנעורי יאמר נא ישראל׃ | 1 |
Abụ nrigo. Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ka Izrel kwuo.
רבת צררוני מנעורי גם לא יכלו לי׃ | 2 |
“Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, ma ha enweghị ike merie m.
על גבי חרשו חרשים האריכו למענותם׃ | 3 |
Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo.
יהוה צדיק קצץ עבות רשעים׃ | 4 |
Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.”
יבשו ויסגו אחור כל שנאי ציון׃ | 5 |
Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere.
יהיו כחציר גגות שקדמת שלף יבש׃ | 6 |
Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ nke na-akpọnwụ tupu o pupụta;
שלא מלא כפו קוצר וחצנו מעמר׃ | 7 |
nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya.
ולא אמרו העברים ברכת יהוה אליכם ברכנו אתכם בשם יהוה׃ | 8 |
Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, “Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”