< תהילים 127 >

שיר המעלות לשלמה אם יהוה לא יבנה בית שוא עמלו בוניו בו אם יהוה לא ישמר עיר שוא שקד שומר׃ 1
Abụ nrigo, nke Solomọn. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya.
שוא לכם משכימי קום מאחרי שבת אכלי לחם העצבים כן יתן לידידו שנא׃ 2
Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo.
הנה נחלת יהוה בנים שכר פרי הבטן׃ 3
Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye.
כחצים ביד גבור כן בני הנעורים׃ 4
Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị.
אשרי הגבר אשר מלא את אשפתו מהם לא יבשו כי ידברו את אויבים בשער׃ 5
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro na-arụrịta ụka nʼama.

< תהילים 127 >