< תהילים 121 >
שיר למעלות אשא עיני אל ההרים מאין יבא עזרי׃ | 1 |
Abụ nrigo. Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, olee ebe inyeaka ga-esi bịara m?
עזרי מעם יהוה עשה שמים וארץ׃ | 2 |
Inyeaka m na-esite nʼaka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa bịa.
אל יתן למוט רגלך אל ינום שמרך׃ | 3 |
Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile;
הנה לא ינום ולא יישן שומר ישראל׃ | 4 |
nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra.
יהוה שמרך יהוה צלך על יד ימינך׃ | 5 |
Onyenwe anyị na-eche gị nche, Onyenwe anyị bụ ndo gị nʼaka nri gị;
יומם השמש לא יככה וירח בלילה׃ | 6 |
anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị.
יהוה ישמרך מכל רע ישמר את נפשך׃ | 7 |
Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile.
יהוה ישמר צאתך ובואך מעתה ועד עולם׃ | 8 |
Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.