< קֹהֶלֶת 9 >
כי את כל זה נתתי אל לבי ולבור את כל זה אשר הצדיקים והחכמים ועבדיהם ביד האלהים גם אהבה גם שנאה אין יודע האדם הכל לפניהם׃ | 1 |
Ihe ndị a niile ka m tulere nke ọma nʼobi m, kpebie na ihe ndị ezi omume na ndị maara ihe na-eme dị nʼaka Chineke, ma ọ dịghị onye maara ihe na-echere ha maọbụ ịhụnanya maọbụ ịkpọ asị.
הכל כאשר לכל מקרה אחד לצדיק ולרשע לטוב ולטהור ולטמא ולזבח ולאשר איננו זבח כטוב כחטא הנשבע כאשר שבועה ירא׃ | 2 |
Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja. Dịka ọ dịrị ezi mmadụ, otu a ka ọ dịrị onye mmehie; dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi, otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ.
זה רע בכל אשר נעשה תחת השמש כי מקרה אחד לכל וגם לב בני האדם מלא רע והוללות בלבבם בחייהם ואחריו אל המתים׃ | 3 |
Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.
כי מי אשר יבחר אל כל החיים יש בטחון כי לכלב חי הוא טוב מן האריה המת׃ | 4 |
Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.
כי החיים יודעים שימתו והמתים אינם יודעים מאומה ואין עוד להם שכר כי נשכח זכרם׃ | 5 |
Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla; ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ, nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.
גם אהבתם גם שנאתם גם קנאתם כבר אבדה וחלק אין להם עוד לעולם בכל אשר נעשה תחת השמש׃ | 6 |
Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha, na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ. Ha agaghị enwekwa oke nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.
לך אכל בשמחה לחמך ושתה בלב טוב יינך כי כבר רצה האלהים את מעשיך׃ | 7 |
Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị.
בכל עת יהיו בגדיך לבנים ושמן על ראשך אל יחסר׃ | 8 |
Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.
ראה חיים עם אשה אשר אהבת כל ימי חיי הבלך אשר נתן לך תחת השמש כל ימי הבלך כי הוא חלקך בחיים ובעמלך אשר אתה עמל תחת השמש׃ | 9 |
Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
כל אשר תמצא ידך לעשות בכחך עשה כי אין מעשה וחשבון ודעת וחכמה בשאול אשר אתה הלך שמה׃ (Sheol ) | 10 |
Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga. (Sheol )
שבתי וראה תחת השמש כי לא לקלים המרוץ ולא לגבורים המלחמה וגם לא לחכמים לחם וגם לא לנבנים עשר וגם לא לידעים חן כי עת ופגע יקרה את כלם׃ | 11 |
Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe, ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha; ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị, ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị; kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.
כי גם לא ידע האדם את עתו כדגים שנאחזים במצודה רעה וכצפרים האחזות בפח כהם יוקשים בני האדם לעת רעה כשתפול עליהם פתאם׃ | 12 |
Nke ka nke, ọ dịghị mmadụ ọbụla maara mgbe oge ya ga-eru: Ọ dị ka nnụnụ nke mara nʼọnya, maọbụ azụ e jidere nʼụgbụ. Dịka ha, ụmụ mmadụ na-adaba nʼọnya nke ihe ọjọọ mgbe ha na-atụghị anya ya.
גם זה ראיתי חכמה תחת השמש וגדולה היא אלי׃ | 13 |
Ahụkwara m ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ, nke a bụ ụdị amamihe nke metụrụ m nʼobi nʼebe ọ dị ukwuu.
עיר קטנה ואנשים בה מעט ובא אליה מלך גדול וסבב אתה ובנה עליה מצודים גדלים׃ | 14 |
Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya.
ומצא בה איש מסכן חכם ומלט הוא את העיר בחכמתו ואדם לא זכר את האיש המסכן ההוא׃ | 15 |
Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya.
ואמרתי אני טובה חכמה מגבורה וחכמת המסכן בזויה ודבריו אינם נשמעים׃ | 16 |
Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.
דברי חכמים בנחת נשמעים מזעקת מושל בכסילים׃ | 17 |
Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ, karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu.
טובה חכמה מכלי קרב וחוטא אחד יאבד טובה הרבה׃ | 18 |
Amamihe ka ihe agha niile mma, ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.