< דברי הימים א 11 >

ויקבצו כל ישראל אל דויד חברונה לאמר הנה עצמך ובשרך אנחנו׃ 1
Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
גם תמול גם שלשום גם בהיות שאול מלך אתה המוציא והמביא את ישראל ויאמר יהוה אלהיך לך אתה תרעה את עמי את ישראל ואתה תהיה נגיד על עמי ישראל׃ 2
Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’”
ויבאו כל זקני ישראל אל המלך חברונה ויכרת להם דויד ברית בחברון לפני יהוה וימשחו את דויד למלך על ישראל כדבר יהוה ביד שמואל׃ 3
Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
וילך דויד וכל ישראל ירושלם היא יבוס ושם היבוסי ישבי הארץ׃ 4
Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ,
ויאמרו ישבי יבוס לדויד לא תבוא הנה וילכד דויד את מצדת ציון היא עיר דויד׃ 5
gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
ויאמר דויד כל מכה יבוסי בראשונה יהיה לראש ולשר ויעל בראשונה יואב בן צרויה ויהי לראש׃ 6
Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
וישב דויד במצד על כן קראו לו עיר דויד׃ 7
Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid.
ויבן העיר מסביב מן המלוא ועד הסביב ויואב יחיה את שאר העיר׃ 8
O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ.
וילך דויד הלוך וגדול ויהוה צבאות עמו׃ 9
Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya.
ואלה ראשי הגבורים אשר לדויד המתחזקים עמו במלכותו עם כל ישראל להמליכו כדבר יהוה על ישראל׃ 10
Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa.
ואלה מספר הגברים אשר לדויד ישבעם בן חכמוני ראש השלושים הוא עורר את חניתו על שלש מאות חלל בפעם אחת׃ 11
Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere: Jashobeam, onye Hakmon, bụ onyeisi nʼetiti ndịisi ndị ọzọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
ואחריו אלעזר בן דודו האחוחי הוא בשלושה הגברים׃ 12
Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ.
הוא היה עם דויד בפס דמים והפלשתים נאספו שם למלחמה ותהי חלקת השדה מלאה שעורים והעם נסו מפני פלשתים׃ 13
Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia.
ויתיצבו בתוך החלקה ויצילוה ויכו את פלשתים ויושע יהוה תשועה גדולה׃ 14
Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
וירדו שלושה מן השלושים ראש על הצר אל דויד אל מערת עדלם ומחנה פלשתים חנה בעמק רפאים׃ 15
Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
ודויד אז במצודה ונציב פלשתים אז בבית לחם׃ 16
Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem.
ויתאו דויד ויאמר מי ישקני מים מבור בית לחם אשר בשער׃ 17
Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
ויבקעו השלשה במחנה פלשתים וישאבו מים מבור בית לחם אשר בשער וישאו ויבאו אל דויד ולא אבה דויד לשתותם וינסך אתם ליהוה׃ 18
Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị,
ויאמר חלילה לי מאלהי מעשות זאת הדם האנשים האלה אשתה בנפשותם כי בנפשותם הביאום ולא אבה לשתותם אלה עשו שלשת הגבורים׃ 19
“Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
ואבשי אחי יואב הוא היה ראש השלושה והוא עורר את חניתו על שלש מאות חלל ולא שם בשלושה׃ 20
Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
מן השלושה בשנים נכבד ויהי להם לשר ועד השלושה לא בא׃ 21
Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
בניה בן יהוידע בן איש חיל רב פעלים מן קבצאל הוא הכה את שני אריאל מואב והוא ירד והכה את הארי בתוך הבור ביום השלג׃ 22
Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
והוא הכה את האיש המצרי איש מדה חמש באמה וביד המצרי חנית כמנור ארגים וירד אליו בשבט ויגזל את החנית מיד המצרי ויהרגהו בחניתו׃ 23
O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya.
אלה עשה בניהו בן יהוידע ולו שם בשלושה הגברים׃ 24
Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ.
מן השלושים הנו נכבד הוא ואל השלושה לא בא וישימהו דויד על משמעתו׃ 25
A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
וגבורי החילים עשה אל אחי יואב אלחנן בן דודו מבית לחם׃ 26
Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a: Asahel nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo onye Betlehem,
שמות ההרורי חלץ הפלוני׃ 27
Shamot onye Haroa, Helez onye Pelon,
עירא בן עקש התקועי אביעזר הענתותי׃ 28
Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, Abieza onye Anatot,
סבכי החשתי עילי האחוחי׃ 29
Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahohi,
מהרי הנטפתי חלד בן בענה הנטופתי׃ 30
Maharai onye Netofa, Heled nwa Baana, onye Netofa,
איתי בן ריבי מגבעת בני בנימן בניה הפרעתני׃ 31
Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, Benaya onye Piraton,
חורי מנחלי געש אביאל הערבתי׃ 32
Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, Abiel onye Arba,
עזמות הבחרומי אליחבא השעלבני׃ 33
Azmavet onye Baharum, Eliaba onye Shaalbon,
בני השם הגזוני יונתן בן שגה ההררי׃ 34
Ụmụ Hashem onye Gizon, Jonatan nwa Shagee, onye Hara,
אחיאם בן שכר ההררי אליפל בן אור׃ 35
Ahiam nwa Saka, onye Hara, Elifal nwa Ụọ,
חפר המכרתי אחיה הפלני׃ 36
Hefa onye Mekerat, Ahija onye Pelon,
חצרו הכרמלי נערי בן אזבי׃ 37
Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai,
יואל אחי נתן מבחר בן הגרי׃ 38
Juel nwanne Netan, Miba nwa Hagri,
צלק העמוני נחרי הברתי נשא כלי יואב בן צרויה׃ 39
Zelek onye Amọn, Naharai onye Beerọt, onye na-ebu ngwa agha Joab, nwa Zeruaya,
עירא היתרי גרב היתרי׃ 40
Ira onye Itra, Gareb onye Itra,
אוריה החתי זבד בן אחלי׃ 41
Ụraya onye Het, Zabad nwa Alai,
עדינא בן שיזא הראובני ראש לראובני ועליו שלושים׃ 42
Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya.
חנן בן מעכה ויושפט המתני׃ 43
Hanan nwa Maaka, Joshafat onye Mitna,
עזיא העשתרתי שמע ויעואל בני חותם הערערי׃ 44
Ụzia onye Ashterat, Shama na Jeiel ụmụ Hotam, onye Aroea,
ידיעאל בן שמרי ויחא אחיו התיצי׃ 45
Jediael nwa Shimri, Joha nwanne ya, onye Tiza,
אליאל המחוים ויריבי ויושויה בני אלנעם ויתמה המואבי׃ 46
Eliel onye Mahavi, Jeribai na Joshavia ụmụ Elnaam, Itma onye Moab,
אליאל ועובד ויעשיאל המצביה׃ 47
Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.

< דברי הימים א 11 >