< יְשַׁעְיָהוּ 34 >

קִרְב֤וּ גוֹיִם֙ לִשְׁמֹ֔עַ וּלְאֻמִּ֖ים הַקְשִׁ֑יבוּ תִּשְׁמַ֤ע הָאָ֙רֶץ֙ וּמְלֹאָ֔הּ תֵּבֵ֖ל וְכָל־צֶאֱצָאֶֽיהָ׃ 1
Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị. Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa. Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya, na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.
כִּ֣י קֶ֤צֶף לַֽיהוָה֙ עַל־כָּל־הַגּוֹיִ֔ם וְחֵמָ֖ה עַל־כָּל־צְבָאָ֑ם הֶחֱרִימָ֖ם נְתָנָ֥ם לַטָּֽבַח׃ 2
Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe, iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile. Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam, nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.
וְחַלְלֵיהֶ֣ם יֻשְׁלָ֔כוּ וּפִגְרֵיהֶ֖ם יַעֲלֶ֣ה בָאְשָׁ֑ם וְנָמַ֥סּוּ הָרִ֖ים מִדָּמָֽם׃ 3
Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ. Ozu ha ga-esikwa isi. Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.
וְנָמַ֙קּוּ֙ כָּל־צְבָ֣א הַשָּׁמַ֔יִם וְנָגֹ֥לּוּ כַסֵּ֖פֶר הַשָּׁמָ֑יִם וְכָל־צְבָאָ֣ם יִבּ֔וֹל כִּנְבֹ֤ל עָלֶה֙ מִגֶּ֔פֶן וּכְנֹבֶ֖לֶת מִתְּאֵנָֽה׃ 4
Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze, a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ, kpakpando niile ga-ada dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ, dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.
כִּֽי־רִוְּתָ֥ה בַשָּׁמַ֖יִם חַרְבִּ֑י הִנֵּה֙ עַל־אֱד֣וֹם תֵּרֵ֔ד וְעַל־עַ֥ם חֶרְמִ֖י לְמִשְׁפָּֽט׃ 5
Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe, lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm, ndị m mara ikpe mbibi.
חֶ֣רֶב לַיהוָ֞ה מָלְאָ֥ה דָם֙ הֻדַּ֣שְׁנָה מֵחֵ֔לֶב מִדַּ֤ם כָּרִים֙ וְעַתּוּדִ֔ים מֵחֵ֖לֶב כִּלְי֣וֹת אֵילִ֑ים כִּ֣י זֶ֤בַח לַֽיהוָה֙ בְּבָצְרָ֔ה וְטֶ֥בַח גָּד֖וֹל בְּאֶ֥רֶץ אֱדֽוֹם׃ 6
Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara, abụba kpuchikwara ya, ọbara ụmụ atụrụ na mkpi na abụba sitere nʼakụrụ ebule nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra. O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
וְיָרְד֤וּ רְאֵמִים֙ עִמָּ֔ם וּפָרִ֖ים עִם־אַבִּירִ֑ים וְרִוְּתָ֤ה אַרְצָם֙ מִדָּ֔ם וַעֲפָרָ֖ם מֵחֵ֥לֶב יְדֻשָּֽׁן׃ 7
Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa, ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta. Ala ga-ejupụta nʼọbara ha. Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.
כִּ֛י י֥וֹם נָקָ֖ם לַֽיהוָ֑ה שְׁנַ֥ת שִׁלּוּמִ֖ים לְרִ֥יב צִיּֽוֹן׃ 8
Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ. Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
וְנֶהֶפְכ֤וּ נְחָלֶ֙יהָ֙ לְזֶ֔פֶת וַעֲפָרָ֖הּ לְגָפְרִ֑ית וְהָיְתָ֣ה אַרְצָ֔הּ לְזֶ֖פֶת בֹּעֵרָֽה׃ 9
Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii, uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ), ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.
לַ֤יְלָה וְיוֹמָם֙ לֹ֣א תִכְבֶּ֔ה לְעוֹלָ֖ם יַעֲלֶ֣ה עֲשָׁנָ֑הּ מִדּ֤וֹר לָדוֹר֙ תֶּחֱרָ֔ב לְנֵ֣צַח נְצָחִ֔ים אֵ֥ין עֹבֵ֖ר בָּֽהּ׃ 10
Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie; anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi. Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
וִירֵשׁ֙וּהָ֙ קָאַ֣ת וְקִפּ֔וֹד וְיַנְשׁ֥וֹף וְעֹרֵ֖ב יִשְׁכְּנוּ־בָ֑הּ וְנָטָ֥ה עָלֶ֛יהָ קַֽו־תֹ֖הוּ וְאַבְנֵי־בֹֽהוּ׃ 11
Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya, ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ. Chineke ga-eseti nʼelu Edọm, eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara, na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.
חֹרֶ֥יהָ וְאֵֽין־שָׁ֖ם מְלוּכָ֣ה יִקְרָ֑אוּ וְכָל־שָׂרֶ֖יהָ יִ֥הְיוּ אָֽפֶס׃ 12
Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze. Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.
וְעָלְתָ֤ה אַרְמְנֹתֶ֙יהָ֙ סִירִ֔ים קִמּ֥וֹשׂ וָח֖וֹחַ בְּמִבְצָרֶ֑יהָ וְהָיְתָה֙ נְוֵ֣ה תַנִּ֔ים חָצִ֖יר לִבְנ֥וֹת יַעֲנָֽה׃ 13
Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile; ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu, ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa na nke ikwighịkwighị.
וּפָגְשׁ֤וּ צִיִּים֙ אֶת־אִיִּ֔ים וְשָׂעִ֖יר עַל־רֵעֵ֣הוּ יִקְרָ֑א אַךְ־שָׁם֙ הִרְגִּ֣יעָה לִּילִ֔ית וּמָצְאָ֥ה לָ֖הּ מָנֽוֹחַ׃ 14
Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.
שָׁ֣מָּה קִנְּנָ֤ה קִפּוֹז֙ וַתְּמַלֵּ֔ט וּבָקְעָ֖ה וְדָגְרָ֣ה בְצִלָּ֑הּ אַךְ־שָׁ֛ם נִקְבְּצ֥וּ דַיּ֖וֹת אִשָּׁ֥ה רְעוּתָֽהּ׃ 15
Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ. Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya, lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha. Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa, nke ọbụla na ibe ya.
דִּרְשׁ֨וּ מֵֽעַל־סֵ֤פֶר יְהוָה֙ וּֽקְרָ֔אוּ אַחַ֤ת מֵהֵ֙נָּה֙ לֹ֣א נֶעְדָּ֔רָה אִשָּׁ֥ה רְעוּתָ֖הּ לֹ֣א פָקָ֑דוּ כִּֽי־פִי֙ ה֣וּא צִוָּ֔ה וְרוּח֖וֹ ה֥וּא קִבְּצָֽן׃ 16
Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime: Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu. Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya, nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a. Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.
וְהֽוּא־הִפִּ֤יל לָהֶן֙ גּוֹרָ֔ל וְיָד֛וֹ חִלְּקַ֥תָּה לָהֶ֖ם בַּקָּ֑ו עַד־עוֹלָם֙ יִֽירָשׁ֔וּהָ לְד֥וֹר וָד֖וֹר יִשְׁכְּנוּ־בָֽהּ׃ ס 17
Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ, jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ. Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi, nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

< יְשַׁעְיָהוּ 34 >