< תְהִלִּים 99 >

יְהוָ֣ה מָ֭לָךְ יִרְגְּז֣וּ עַמִּ֑ים יֹשֵׁ֥ב כְּ֝רוּבִ֗ים תָּנ֥וּט הָאָֽרֶץ׃ 1
Onyenwe anyị bụ eze, ka mba niile maa jijiji! O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, ka elu ụwa maa jijiji.
יְ֭הוָה בְּצִיּ֣וֹן גָּד֑וֹל וְרָ֥ם ה֝֗וּא עַל־כָּל־הָֽעַמִּֽים׃ 2
Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn; ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.
יוֹד֣וּ שִׁ֭מְךָ גָּד֥וֹל וְנוֹרָ֗א קָד֥וֹשׁ הֽוּא׃ 3
Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, ọ dị nsọ.
וְעֹ֥ז מֶלֶךְ֮ מִשְׁפָּ֪ט אָ֫הֵ֥ב אַ֭תָּה כּוֹנַ֣נְתָּ מֵישָׁרִ֑ים מִשְׁפָּ֥ט וּ֝צְדָקָ֗ה בְּיַעֲקֹ֤ב ׀ אַתָּ֬ה עָשִֽׂיתָ׃ 4
Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; nʼime Jekọb ka i mere ihe ziri ezi na ihe dị mma.
רֽוֹמְמ֡וּ יְה֘וָ֤ה אֱלֹהֵ֗ינוּ וְֽ֭הִשְׁתַּחֲווּ לַהֲדֹ֥ם רַגְלָ֗יו קָד֥וֹשׁ הֽוּא׃ 5
Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; ọ dị nsọ.
מֹ֘שֶׁ֤ה וְאַהֲרֹ֨ן ׀ בְּֽכֹהֲנָ֗יו וּ֭שְׁמוּאֵל בְּקֹרְאֵ֣י שְׁמ֑וֹ קֹרִ֥אים אֶל־יְ֝הוָ֗ה וְה֣וּא יַעֲנֵֽם׃ 6
Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; ha kpọkuru Onyenwe anyị ọ zakwara ha.
בְּעַמּ֣וּד עָ֭נָן יְדַבֵּ֣ר אֲלֵיהֶ֑ם שָׁמְר֥וּ עֵ֝דֹתָ֗יו וְחֹ֣ק נָֽתַן־לָֽמוֹ׃ 7
Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.
יְהוָ֣ה אֱלֹהֵינוּ֮ אַתָּ֪ה עֲנִ֫יתָ֥ם אֵ֣ל נֹ֭שֵׂא הָיִ֣יתָ לָהֶ֑ם וְ֝נֹקֵ֗ם עַל־עֲלִילוֹתָֽם׃ 8
O Onyenwe anyị, Chineke anyị, ị zara ha; ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.
רֽוֹמְמ֡וּ יְה֘וָ֤ה אֱלֹהֵ֗ינוּ וְ֭הִֽשְׁתַּחֲווּ לְהַ֣ר קָדְשׁ֑וֹ כִּֽי־קָ֝ד֗וֹשׁ יְהוָ֥ה אֱלֹהֵֽינוּ׃ 9
Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.

< תְהִלִּים 99 >