< תהילים 76 >

לַמְנַצֵּחַ בִּנְגִינֹת מִזְמוֹר לְאָסָף שִֽׁיר׃ נוֹדָע בִּיהוּדָה אֱלֹהִים בְּיִשְׂרָאֵל גָּדוֹל שְׁמֽוֹ׃ 1
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ. A maara Chineke nʼobodo Juda; aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.
וַיְהִי בְשָׁלֵם סוּכּוֹ וּמְעוֹנָתוֹ בְצִיּֽוֹן׃ 2
Ụlọ ikwu ya dị na Salem, ebe obibi ya dị na Zayọn
שָׁמָּה שִׁבַּר רִשְׁפֵי־קָשֶׁת מָגֵן וְחֶרֶב וּמִלְחָמָה סֶֽלָה׃ 3
Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma, na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. (Sela)
נָאוֹר אַתָּה אַדִּיר מֵֽהַרְרֵי־טָֽרֶף׃ 4
Ị jupụtara nʼìhè, ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.
אֶשְׁתּֽוֹלְלוּ ׀ אַבִּירֵי לֵב נָמוּ שְׁנָתָם וְלֹֽא־מָצְאוּ כׇל־אַנְשֵׁי־חַיִל יְדֵיהֶֽם׃ 5
A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha, ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha; o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a pụrụ iweli aka ya abụọ elu.
מִגַּעֲרָתְךָ אֱלֹהֵי יַעֲקֹב נִרְדָּם וְרֶכֶב וָסֽוּס׃ 6
Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb, ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.
אַתָּה ׀ נוֹרָא אַתָּה וּמִֽי־יַעֲמֹד לְפָנֶיךָ מֵאָז אַפֶּֽךָ׃ 7
Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?
מִשָּׁמַיִם הִשְׁמַעְתָּ דִּין אֶרֶץ יָֽרְאָה וְשָׁקָֽטָה׃ 8
I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị. Ụwa tụkwara egwu, dere duu,
בְּקוּם־לַמִּשְׁפָּט אֱלֹהִים לְהוֹשִׁיעַ כׇּל־עַנְוֵי־אֶרֶץ סֶֽלָה׃ 9
mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe, ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. (Sela)
כִּֽי־חֲמַת אָדָם תּוֹדֶךָּ שְׁאֵרִית חֵמֹת תַּחְגֹּֽר׃ 10
Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto, ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.
נִדְרוּ וְשַׁלְּמוּ לַיהֹוָה אֱֽלֹהֵיכֶם כׇּל־סְבִיבָיו יֹבִילוּ שַׁי לַמּוֹרָֽא׃ 11
Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha; ka ndị ala niile bụ agbataobi unu wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.
יִבְצֹר רוּחַ נְגִידִים נוֹרָא לְמַלְכֵי־אָֽרֶץ׃ 12
Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala; ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.

< תהילים 76 >