< תהילים 58 >
לַמְנַצֵּחַ אַל־תַּשְׁחֵת לְדָוִד מִכְתָּֽם׃ הַאֻמְנָם אֵלֶם צֶדֶק תְּדַבֵּרוּן מֵישָׁרִים תִּשְׁפְּטוּ בְּנֵי אָדָֽם׃ | 1 |
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam. Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?
אַף־בְּלֵב עוֹלֹת תִּפְעָלוּן בָּאָרֶץ חֲמַס יְדֵיכֶם תְּפַלֵּסֽוּן׃ | 2 |
Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.
זֹרוּ רְשָׁעִים מֵרָחֶם תָּעוּ מִבֶּטֶן דֹּבְרֵי כָזָֽב׃ | 3 |
Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.
חֲמַת־לָמוֹ כִּדְמוּת חֲמַת־נָחָשׁ כְּמוֹ־פֶתֶן חֵרֵשׁ יַאְטֵם אׇזְנֽוֹ׃ | 4 |
Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,
אֲשֶׁר לֹֽא־יִשְׁמַע לְקוֹל מְלַחֲשִׁים חוֹבֵר חֲבָרִים מְחֻכָּֽם׃ | 5 |
nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.
אֱֽלֹהִים הֲרׇס־שִׁנֵּימֽוֹ בְּפִימוֹ מַלְתְּעוֹת כְּפִירִים נְתֹץ ׀ יְהֹוָֽה׃ | 6 |
O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!
יִמָּאֲסוּ כְמוֹ־מַיִם יִתְהַלְּכוּ־לָמוֹ יִדְרֹךְ חִצָּו כְּמוֹ יִתְמֹלָֽלוּ׃ | 7 |
Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.
כְּמוֹ שַׁבְּלוּל תֶּמֶס יַהֲלֹךְ נֵפֶל אֵשֶׁת בַּל־חָזוּ שָֽׁמֶשׁ׃ | 8 |
Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.
בְּטֶרֶם ׀ יָבִינוּ סִּירֹתֵכֶם אָטָד כְּמוֹ־חַי כְּמוֹ־חָרוֹן יִשְׂעָרֶֽנּוּ׃ | 9 |
Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.
יִשְׂמַח צַדִּיק כִּי־חָזָה נָקָם פְּעָמָיו יִרְחַץ בְּדַם הָרָשָֽׁע׃ | 10 |
Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.
וְיֹאמַר אָדָם אַךְ־פְּרִי לַצַּדִּיק אַךְ יֵשׁ־אֱלֹהִים שֹׁפְטִים בָּאָֽרֶץ׃ | 11 |
Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, “Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”