< תהילים 53 >
לַמְנַצֵּחַ עַֽל־מָחֲלַת מַשְׂכִּיל לְדָוִֽד׃ אָמַר נָבָל בְּלִבּוֹ אֵין אֱלֹהִים הִֽשְׁחִיתוּ וְהִֽתְעִיבוּ עָוֶל אֵין עֹֽשֵׂה־טֽוֹב׃ | 1 |
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid. Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.
אֱֽלֹהִים מִשָּׁמַיִם הִשְׁקִיף עַֽל־בְּנֵי־אָדָם לִרְאוֹת הֲיֵשׁ מַשְׂכִּיל דֹּרֵשׁ אֶת־אֱלֹהִֽים׃ | 2 |
Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke.
כֻּלּוֹ סָג יַחְדָּו נֶאֱלָחוּ אֵין עֹֽשֵׂה־טוֹב אֵין גַּם־אֶחָֽד׃ | 3 |
Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
הֲלֹא יָדְעוּ פֹּעֲלֵי אָוֶן אֹכְלֵי עַמִּי אָכְלוּ לֶחֶם אֱלֹהִים לֹא קָרָֽאוּ׃ | 4 |
Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Chineke.
שָׁם ׀ פָּחֲדוּ פַחַד לֹא־הָיָה פָחַד כִּֽי־אֱלֹהִים פִּזַּר עַצְמוֹת חֹנָךְ הֱבִשֹׁתָה כִּֽי־אֱלֹהִים מְאָסָֽם׃ | 5 |
Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị. Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị; i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.
מִי יִתֵּן מִצִּיּוֹן יְשֻׁעוֹת יִשְׂרָאֵל בְּשׁוּב אֱלֹהִים שְׁבוּת עַמּוֹ יָגֵל יַעֲקֹב יִשְׂמַח יִשְׂרָאֵֽל׃ | 6 |
O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!