< תהילים 36 >

לַמְנַצֵּחַ ׀ לְעֶבֶד־יְהֹוָה לְדָוִֽד׃ נְאֻֽם־פֶּשַׁע לָרָשָׁע בְּקֶרֶב לִבִּי אֵֽין־פַּחַד אֱלֹהִים לְנֶגֶד עֵינָֽיו׃ 1
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị. E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke dị nʼanya ha.
כִּֽי־הֶחֱלִיק אֵלָיו בְּעֵינָיו לִמְצֹא עֲוֺנוֹ לִשְׂנֹֽא׃ 2
Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị.
דִּבְרֵי־פִיו אָוֶן וּמִרְמָה חָדַל לְהַשְׂכִּיל לְהֵיטִֽיב׃ 3
Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma.
אָוֶן ׀ יַחְשֹׁב עַֽל־מִשְׁכָּבוֹ יִתְיַצֵּב עַל־דֶּרֶךְ לֹא־טוֹב רָע לֹא יִמְאָֽס׃ 4
Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
יְהֹוָה בְּהַשָּׁמַיִם חַסְדֶּךָ אֱמוּנָתְךָ עַד־שְׁחָקִֽים׃ 5
O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe.
צִדְקָתְךָ ׀ כְּֽהַרְרֵי־אֵל מִשְׁפָּטֶיךָ תְּהוֹם רַבָּה אָדָֽם וּבְהֵמָה תוֹשִׁיעַ יְהֹוָֽה׃ 6
Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ.
מַה־יָּקָר חַסְדְּךָ אֱלֹהִים וּבְנֵי אָדָם בְּצֵל כְּנָפֶיךָ יֶחֱסָיֽוּן׃ 7
Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ.
יִרְוְיֻן מִדֶּשֶׁן בֵּיתֶךָ וְנַחַל עֲדָנֶיךָ תַשְׁקֵֽם׃ 8
Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị.
כִּֽי־עִמְּךָ מְקוֹר חַיִּים בְּאוֹרְךָ נִרְאֶה־אֽוֹר׃ 9
Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.
מְשֹׁךְ חַסְדְּךָ לְיֹדְעֶיךָ וְצִדְקָֽתְךָ לְיִשְׁרֵי־לֵֽב׃ 10
Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi.
אַל־תְּבוֹאֵנִי רֶגֶל גַּאֲוָה וְיַד־רְשָׁעִים אַל־תְּנִדֵֽנִי׃ 11
Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo.
שָׁם נָפְלוּ פֹּעֲלֵי אָוֶן דֹּחוּ וְלֹא־יָכְלוּ קֽוּם׃ 12
Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

< תהילים 36 >