< תהילים 132 >

שִׁיר הַֽמַּעֲלוֹת זְכוֹר־יְהֹוָה לְדָוִד אֵת כׇּל־עֻנּוֹתֽוֹ׃ 1
Abụ nrigo. O Onyenwe anyị, cheta Devid, nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ.
אֲשֶׁר נִשְׁבַּע לַֽיהֹוָה נָדַר לַאֲבִיר יַעֲקֹֽב׃ 2
Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb:
אִם־אָבֹא בְּאֹהֶל בֵּיתִי אִם־אֶעֱלֶה עַל־עֶרֶשׂ יְצוּעָֽי׃ 3
“Agaghị m abanye nʼime ụlọ m maọbụ rigoo nʼihe ndina m,
אִם־אֶתֵּן שְׁנַת לְעֵינָי לְֽעַפְעַפַּי תְּנוּמָֽה׃ 4
agaghị m arahụ ụra, egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra,
עַד־אֶמְצָא מָקוֹם לַיהֹוָה מִשְׁכָּנוֹת לַאֲבִיר יַעֲקֹֽב׃ 5
tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.”
הִנֵּֽה־שְׁמַעֲנוּהָ בְאֶפְרָתָה מְצָאנוּהָ בִּשְׂדֵי־יָֽעַר׃ 6
Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim.
נָבוֹאָה לְמִשְׁכְּנוֹתָיו נִשְׁתַּחֲוֶה לַהֲדֹם רַגְלָֽיו׃ 7
“Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
קוּמָה יְהֹוָה לִמְנוּחָתֶךָ אַתָּה וַאֲרוֹן עֻזֶּֽךָ׃ 8
‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.
כֹּהֲנֶיךָ יִלְבְּשׁוּ־צֶדֶק וַחֲסִידֶיךָ יְרַנֵּֽנוּ׃ 9
Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’”
בַּֽעֲבוּר דָּוִד עַבְדֶּךָ אַל־תָּשֵׁב פְּנֵי מְשִׁיחֶֽךָ׃ 10
Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
נִשְׁבַּֽע־יְהֹוָה ׀ לְדָוִד אֱמֶת לֹא־יָשׁוּב מִמֶּנָּה מִפְּרִי בִטְנְךָ אָשִׁית לְכִסֵּא־לָֽךְ׃ 11
Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,
אִֽם־יִשְׁמְרוּ בָנֶיךָ ׀ בְּרִיתִי וְעֵדֹתִי זוֹ אֲלַמְּדֵם גַּם־בְּנֵיהֶם עֲדֵי־עַד יֵשְׁבוּ לְכִסֵּא־לָֽךְ׃ 12
ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”
כִּי־בָחַר יְהֹוָה בְּצִיּוֹן אִוָּהּ לְמוֹשָׁב לֽוֹ׃ 13
Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;
זֹאת־מְנוּחָתִי עֲדֵי־עַד פֹּה־אֵשֵׁב כִּי אִוִּתִֽיהָ׃ 14
“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
צֵידָהּ בָּרֵךְ אֲבָרֵךְ אֶבְיוֹנֶיהָ אַשְׂבִּיעַֽ לָֽחֶם׃ 15
Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.
וְֽכֹהֲנֶיהָ אַלְבִּישׁ יֶשַׁע וַחֲסִידֶיהָ רַנֵּן יְרַנֵּֽנוּ׃ 16
Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.
שָׁם אַצְמִיחַ קֶרֶן לְדָוִד עָרַכְתִּי נֵר לִמְשִׁיחִֽי׃ 17
“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.
אוֹיְבָיו אַלְבִּישׁ בֹּשֶׁת וְעָלָיו יָצִיץ נִזְרֽוֹ׃ 18
Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”

< תהילים 132 >