< תהילים 92 >
מזמור שיר ליום השבת ב טוב להדות ליהוה ולזמר לשמך עליון | 1 |
Abụ Ọma. Abụ maka ụbọchị izuike. Ọ bụ ihe ziri ezi ito Onyenwe anyị, na iti egwu nye aha gị, gị Onye kachasị ihe niile elu,
להגיד בבקר חסדך ואמונתך בלילות | 2 |
ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị,
עלי-עשור ועלי-נבל עלי הגיון בכנור | 3 |
jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.
כי שמחתני יהוה בפעלך במעשי ידיך ארנן | 4 |
Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o Onyenwe anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ.
מה-גדלו מעשיך יהוה מאד עמקו מחשבתיך | 5 |
Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche.
איש-בער לא ידע וכסיל לא-יבין את-זאת | 6 |
Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta,
בפרח רשעים כמו עשב ויציצו כל-פעלי און להשמדם עדי-עד | 7 |
ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi.
Ma gị, O Onyenwe anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi.
כי הנה איביך יהוה-- כי-הנה איביך יאבדו יתפרדו כל-פעלי און | 9 |
Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị.
ותרם כראים קרני בלתי בשמן רענן | 10 |
I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma.
ותבט עיני בשורי בקמים עלי מרעים-- תשמענה אזני | 11 |
Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri.
צדיק כתמר יפרח כארז בלבנון ישגה | 12 |
Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke Lebanọn,
שתולים בבית יהוה בחצרות אלהינו יפריחו | 13 |
nke a kụrụ nʼime ụlọ Onyenwe anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige Chineke anyị.
עוד ינובון בשיבה דשנים ורעננים יהיו | 14 |
Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ,
להגיד כי-ישר יהוה צורי ולא-עלתה (עולתה) בו | 15 |
na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ Onye ziri ezi; ọ bụ Oke Nkume m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”