< תהילים 9 >

למנצח על-מות לבן מזמור לדוד ב אודה יהוה בכל-לבי אספרה כל-נפלאותיך 1
Abụ Ọma. Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ “Ọnwụ nke Ọkpara.” Abụ ọma Devid. O Onyenwe anyị, aga m esite nʼala ala obi m too gị, aga m agwakwa onye ọbụla ihe ọma niile ị na-eme.
אשמחה ואעלצה בך אזמרה שמך עליון 2
Obi ga-atọ m ụtọ; obi m ga-ejupụta nʼọṅụ nʼihi gị, aga m abụrụ gị abụ otuto, gị Onye kachasị ihe niile elu.
בשוב-אויבי אחור יכשלו ויאבדו מפניך 3
Ndị iro m na-alaghachi azụ, ha na-asọ ngọngọ na-alakwa nʼiyi nʼihu gị.
כי-עשית משפטי ודיני ישבת לכסא שופט צדק 4
I kpeela ikpe m nʼụzọ ziri ezi, nʼocheeze gị ka ị nọdụrụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
גערת גוים אבדת רשע שמם מחית לעולם ועד 5
I baarala mba niile mba ma laa ndị ajọ omume nʼiyi, hichapụkwa aha ha ruo mgbe ebighị ebi.
האויב תמו חרבות--לנצח וערים נתשת--אבד זכרם המה 6
Mbibi nke na-enweghị ọgwụgwụ adakwasịla ndị iro m, I hopukwala obodo ha niile. Ọ dịghị onye na-echetakwa ha ọzọ.
ויהוה לעולם ישב כונן למשפט כסאו 7
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ kwadoola ocheeze ya maka ikpe ikpe ziri ezi.
והוא ישפט-תבל בצדק ידין לאמים במישרים 8
Ọ ga-eji ezi omume kpee mba niile ikpe; jirikwa ikpe ziri ezi chịa mba niile.
ויהי יהוה משגב לדך משגב לעתות בצרה 9
Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba nye ndị niile a na-emegbu emegbu. Ọ bụụrụ ha ebe mgbaba e wusiri ike nʼoge nsogbu.
ויבטחו בך יודעי שמך כי לא-עזבת דרשיך יהוה 10
Onyenwe anyị, ndị niile maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, nʼihi na ọ dịghị mgbe ị na-agbakụta ndị niile na-atụkwasị gị obi azụ.
זמרו--ליהוה ישב ציון הגידו בעמים עלילותיו 11
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ otuto, bụ onye nọ nʼocheeze ya na Zayọn. Kwusaaranụ mba niile ihe banyere ọrụ ebube ya.
כי-דרש דמים אותם זכר לא-שכח צעקת עניים (ענוים) 12
Nʼihi na onye ahụ na-abọrọ ndị e gburu egbu ọbọ anaghị echefu ihe; ọ dịghị elefu mkpu akwa nke ndị a na-akpagbu anya.
חננני יהוה--ראה עניי משנאי מרוממי משערי מות 13
O Onyenwe anyị, lee ka ndị iro m si akpagbu m! Meere m ebere ma napụta m site nʼọnụ ọnwụ,
למען אספרה כל-תהלתיך בשערי בת-ציון--אגילה בישועתך 14
ka m nwee ike ikwusa banyere otuto gị nʼọnụ ụzọ ama niile nke ada Zayọn, nọrọkwa ebe ahụ ṅụrịa ọṅụ nʼime nzọpụta gị.
טבעו גוים בשחת עשו ברשת-זו טמנו נלכדה רגלם 15
Ndị mba niile adabala nʼime olulu ahụ ha gwuru; ọnya ahụ ha siri, zoo, amaala ha.
נודע יהוה--משפט עשה בפעל כפיו נוקש רשע הגיון סלה 16
Ihe e ji mara Onyenwe anyị bụ ikpe ya ziri ezi; ọrụ aka ndị na-emebi iwu na-ama ha dịka ọnya. (Sela)
ישובו רשעים לשאולה כל-גוים שכחי אלהים (Sheol h7585) 17
Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. (Sheol h7585)
כי לא לנצח ישכח אביון תקות ענוים (עניים) תאבד לעד 18
Ma ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a ga-echefu ndị nọ na mkpa; olileanya ndị a na-akpagbu agaghị abụkwa nke efu.
קומה יהוה אל-יעז אנוש ישפטו גוים על-פניך 19
O Onyenwe anyị, bilie! Ekwela ka mmadụ nwee mmeri ọbụla nʼebe ị nọ; ka e kpee mba niile ikpe nʼihu gị.
שיתה יהוה מורה--להם ידעו גוים--אנוש המה סלה 20
O Onyenwe anyị! Mee ka ha maa jijiji nʼoke egwu; mee ka mba niile ghọta na ha bụ naanị mmadụ. (Sela)

< תהילים 9 >