< תהילים 78 >
משכיל לאסף האזינה עמי תורתי הטו אזנכם לאמרי-פי | 1 |
Abụ maskil nke Asaf. Ndị m, nụrụnụ ihe m na-ezi; geenụ ntị nʼokwu ọnụ m.
אפתחה במשל פי אביעה חידות מני-קדם | 2 |
Aga m eji ilu malite okwu m, aga m ekwu ọtụtụ ihe omimi, ihe ndị sitere na mgbe ochie;
אשר שמענו ונדעם ואבותינו ספרו-לנו | 3 |
ihe ndị anyị nụrụla, marakwa, ihe ndị nna nna anyị ha gwara anyị.
לא נכחד מבניהם-- לדור אחרון מספרים תהלות יהוה ועזוזו ונפלאתיו אשר עשה | 4 |
Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a, kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị, na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
ויקם עדות ביעקב ותורה שם בישראל אשר צוה את-אבותינו-- להודיעם לבניהם | 5 |
O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya, mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel, bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị, ka ha kuziere ụmụ ha,
למען ידעו דור אחרון--בנים יולדו יקמו ויספרו לבניהם | 6 |
ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya, ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị, ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
וישימו באלהים כסלם ולא ישכחו מעללי-אל ומצותיו ינצרו | 7 |
Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha, ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche. Ha ga-edebekwa iwu ya niile.
ולא יהיו כאבותם-- דור סורר ומרה דור לא-הכין לבו ולא-נאמנה את-אל רוחו | 8 |
Ha agakwaghị adị ka ndị nna nna ha, ọgbọ ndị nnupu isi na ndị isiike; ndị obi ha na-adịghị nʼebe Chineke nọ, ndị mmụọ ha na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ya.
בני-אפרים נושקי רומי-קשת הפכו ביום קרב | 9 |
Ndị ikom Ifrem, nʼagbanyeghị na ha kwere ụta ha, chigharịrị azụ, gbaa ọsọ nʼụbọchị agha.
לא שמרו ברית אלהים ובתורתו מאנו ללכת | 10 |
Ha edebeghị ọgbụgba ndụ Chineke. Ha jụkwara ibi ndụ dịka iwu ya si dị.
וישכחו עלילותיו ונפלאותיו אשר הראם | 11 |
Ha chefuru ihe o mere, ọrụ ịtụnanya o gosiri ha.
נגד אבותם עשה פלא בארץ מצרים שדה-צען | 12 |
Chineke rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihu nna nna ha nʼala Ijipt na nʼọhịa Zoan.
בקע ים ויעבירם ויצב-מים כמו-נד | 13 |
O kewara oke osimiri, site nʼetiti ya dufee ha. O mere ka mmiri ahụ guzo ọtọ dịka mgbidi.
וינחם בענן יומם וכל-הלילה באור אש | 14 |
O ji igwe ojii duo ha nʼije nʼehihie, jirikwa ìhè sitere nʼọkụ ahụ, duo ha ogologo abalị niile.
יבקע צרים במדבר וישק כתהמות רבה | 15 |
Ọ gbawara oke nkume dị nʼọzara, si otu a nye ha mmiri hiri nne, dịka a ga-asị na ọ bụ mmiri si nʼọtụtụ oke osimiri.
ויוצא נוזלים מסלע ויורד כנהרות מים | 16 |
O mere ka mmiri iyi site na nkume gbapụta, mee ka mmiri rudata dịka osimiri.
ויוסיפו עוד לחטא-לו-- למרות עליון בציה | 17 |
Ha nọgidere na-emehie megide ya. Ha nupuru isi nʼọzara megide Onye kachasị ihe niile elu.
וינסו-אל בלבבם-- לשאל-אכל לנפשם | 18 |
Ha kpachara anya nwaa Chineke ọnwụnwa, mgbe ha rịọrọ ya nri nke obi ha chọrọ.
וידברו באלהים אמרו היוכל אל--לערך שלחן במדבר | 19 |
Ha kwuhiere Chineke; jụọ ya ọnụ sị, “Chineke ọ pụrụ inye anyị ezi nri na mmiri ọṅụṅụ nʼọzara a?
הן הכה-צור ויזובו מים-- ונחלים ישטפו הגם-לחם יוכל תת אם-יכין שאר לעמו | 20 |
Ọ bụ ezie na o tiri nkume ahụ ihe, mee ka mmiri sọpụta, mmiri iyi sọpụtara nʼebe o hiri nne, ma ọ pụrụ inye anyị nri? Ọ pụrụ inye ndị ya anụ?”
לכן שמע יהוה-- ויתעבר ואש נשקה ביעקב וגם-אף עלה בישראל | 21 |
Mgbe Onyenwe anyị nụrụ ihe ha kwuru, iwe were ya; ọkụ ya repịara Jekọb, iwe ọkụ ya biliri megide Izrel.
כי לא האמינו באלהים ולא בטחו בישועתו | 22 |
Nʼihi na ha ekwenyeghị na Chineke, maọbụ tụkwasị obi na nzọpụta ya.
ויצו שחקים ממעל ודלתי שמים פתח | 23 |
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
וימטר עליהם מן לאכל ודגן-שמים נתן למו | 24 |
O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie. O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
לחם אבירים אכל איש צידה שלח להם לשבע | 25 |
Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi. O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.
יסע קדים בשמים וינהג בעזו תימן | 26 |
O sitere nʼeluigwe tọpụ ikuku nke ọwụwa anyanwụ, o jikwa ike ya duo ikuku nke ndịda.
וימטר עליהם כעפר שאר וכחול ימים עוף כנף | 27 |
O zidatara ha anụ dị ukwuu dịka ọ bụ uzuzu, anụ ufe ọnụọgụgụ ha dịka ọnụọgụgụ aja dị nʼala ọnụ oke osimiri.
ויפל בקרב מחנהו סביב למשכנתיו | 28 |
O mere ka ụmụ anụ ufe ndị a daara ha nʼala nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha nakwa gburugburu ụlọ ikwu ha.
ויאכלו וישבעו מאד ותאותם יבא להם | 29 |
Ha riri ihe tutu ruo mgbe ha enwekwaghị ike iri ọzọ, nʼihi na o nyere ha ihe obi ha chọrọ.
לא-זרו מתאותם עוד אכלם בפיהם | 30 |
Ha erisibeghị nri ahụ obi ha chọrọ, anụ ụfọdụ dịkwa ha nʼọnụ,
ואף אלהים עלה בהם ויהרג במשמניהם ובחורי ישראל הכריע | 31 |
mgbe iwe Chineke biliri imegide ha; o tigburu ndị kachasị ike nʼetiti ha, tigbukwaa ụmụ okorobịa ndị Izrel.
בכל-זאת חטאו-עוד ולא-האמינו בנפלאותיו | 32 |
Ma na-eleghị ihe ndị a anya, ha gakwara nʼihu na mmehie ha, jụkwa ikwere nʼọrụ ebube niile Onyenwe anyị rụrụ.
ויכל-בהבל ימיהם ושנותם בבהלה | 33 |
O mere ka ụbọchị ndụ ha bụrụ ihe efu. O mekwara ka afọ ha gwụsịa nʼobi ọlụlọ mmiri.
אם-הרגם ודרשוהו ושבו ושחרו-אל | 34 |
Mgbe ọbụla Chineke tigburu ha, ha na-achọ ya; ha na-alaghachi azụ, chọsie ya ike.
ויזכרו כי-אלהים צורם ואל עליון גאלם | 35 |
Ha na-echeta na Chineke bụ Oke nkume ha, na Chineke nke kachasị ihe niile elu bụrụ ha Onye Mgbapụta.
ויפתוהו בפיהם ובלשונם יכזבו-לו | 36 |
Ma mgbe ahụ, ha ga-eji naanị okwu efu fee ya ofufe, were ire ha na-aghara ya ụgha.
ולבם לא-נכון עמו ולא נאמנו בבריתו | 37 |
Obi ha ekwesịkwaghị ike nye ya. Ha ekwesighị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ ya.
והוא רחום יכפר עון-- ולא-ישחית והרבה להשיב אפו ולא-יעיר כל-חמתו | 38 |
Ma o meere ha ebere. Ọ gbaghara ha mmehie ha. Ọ laghị ha nʼiyi. Ọtụtụ oge ka o jidere iwe ya. Ọ kpalịkwaghị oke iwe ya.
ויזכר כי-בשר המה רוח הולך ולא ישוב | 39 |
Nʼihi na o chetara na ha bụ naanị anụ ahụ nke o kere eke, chetakwa na ha dịka ikuku nke na-adịghị alọghachi azụ mgbe ọ gabigasịrị.
כמה ימרוהו במדבר יעציבוהו בישימון | 40 |
Ọtụtụ oge ka ha nupuru isi megide ya nʼọzara; ha kpasuru ya iwe nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu.
וישובו וינסו אל וקדוש ישראל התוו | 41 |
Mgbe mgbe, ha nwara Chineke; ha kpasuru Onye Nsọ nke Izrel iwe.
לא-זכרו את-ידו יום אשר-פדם מני-צר | 42 |
Ha echetaghị ike ya, ụbọchị ahụ ọ gbapụtara ha site nʼaka ndị na-emegbu ha;
אשר-שם במצרים אתותיו ומופתיו בשדה-צען | 43 |
nʼụbọchị o gosipụtara ihe ịrịbama niile nʼala Ijipt, ọrụ ebube ya niile nʼọhịa Zoan.
ויהפך לדם יאריהם ונזליהם בל-ישתיון | 44 |
O mere ka osimiri ha niile ghọọ ọbara. Ha enwekwaghị ike ịṅụ mmiri si na ha.
ישלח בהם ערב ויאכלם וצפרדע ותשחיתם | 45 |
O zigakwara igwe ijiji nʼetiti ha, nke tara ha, zitekwa awọ nʼala ha, nke bibiri ha.
ויתן לחסיל יבולם ויגיעם לארבה | 46 |
O zitekwara ụmụ ụkpana ndị tachapụrụ mkpụrụ a kụrụ nʼubi ha, zitekwa igurube nke ripịara ihe niile a gaara eweta dịka ihe ubi.
יהרג בברד גפנם ושקמותם בחנמל | 47 |
O ji oke mkpụrụ mmiri mebie osisi vaịnị ha, jirikwa igirigi jụrụ oke oyi bibie osisi sikamọ ha niile.
ויסגר לברד בעירם ומקניהם לרשפים | 48 |
O weere ehi ha niile nyefee mkpụrụ mmiri, werekwa anụ ụlọ ha nyefee amụma egbe eluigwe.
ישלח-בם חרון אפו--עברה וזעם וצרה משלחת מלאכי רעים | 49 |
O zipụrụ iwe ọkụ ya nʼetiti ha, oke iwe ya, na iwe ya, na mmeso nke iwe ya, ndị mmụọ ozi na-ebibi ihe na-eleghị anya nʼazụ.
יפלס נתיב לאפו לא-חשך ממות נפשם וחיתם לדבר הסגיר | 50 |
O doziri ụzọ nke iwe ya ga-eso; o gbochighị ka ha ghara ịnwụ; kama o nyefere ndụ ha nʼaka ọrịa na-efe efe.
ויך כל-בכור במצרים ראשית אונים באהלי-חם | 51 |
O tigburu nwa ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom nʼime ụlọ ikwu Ham.
ויסע כצאן עמו וינהגם כעדר במדבר | 52 |
Ma o dupụtara ndị nke ya dịka igwe atụrụ; o duuru ha dịka atụrụ gafee ọzara.
וינחם לבטח ולא פחדו ואת-אויביהם כסה הים | 53 |
O duuru ha nʼudo, ụjọ atụkwaghị ha, ma osimiri kpuchigidere ndị iro ha.
ויביאם אל-גבול קדשו הר-זה קנתה ימינו | 54 |
Otu a ka o si duru ha bịaruo nʼoke ala nsọ ya, ala ugwu ugwu ahụ nke aka nri ya nwetara.
ויגרש מפניהם גוים-- ויפילם בחבל נחלה וישכן באהליהם שבטי ישראל | 55 |
Ọ chụpụrụ mba niile nʼihu ha, tụọ ala ha kesara ha dịka ihe nketa; o mere ka ebo niile nke Izrel biri nʼụlọ nke aka ha.
וינסו וימרו את-אלהים עליון ועדותיו לא שמרו | 56 |
Ma ha nwara Chineke ọnwụnwa, nupu isi megide Onye kachasị ihe niile elu; ha edebeghị ụkpụrụ ya.
ויסגו ויבגדו כאבותם נהפכו כקשת רמיה | 57 |
Dịka nna nna ha, ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi, na ndị aghụghọ, ha dịka ụta a na-ekweghị nke ọma.
ויכעיסוהו בבמותם ובפסיליהם יקניאוהו | 58 |
Nʼihi ebe nchụaja ha wuru, ha mere ka iwe wee ya; sitekwa nʼarụsị ha pịrị apị, ha kpaliri ekworo ya.
שמע אלהים ויתעבר וימאס מאד בישראל | 59 |
Mgbe Chineke nụrụ ha, iwe were ya nke ukwuu. Ọ jụrụ ndị Izrel kpamkpam.
ויטש משכן שלו אהל שכן באדם | 60 |
Ọ gbakụtara ụlọ nzute ya nke dị na Shaịlo azụ, ụlọ ikwu ahụ ọ mara nʼetiti ndị mmadụ.
ויתן לשבי עזו ותפארתו ביד-צר | 61 |
O nyefere igbe ọgbụgba ndụ ike ya ka a dọta ya nʼagha, o nyefekwara onye iro ahụ ebube ya nʼaka.
ויסגר לחרב עמו ובנחלתו התעבר | 62 |
O kwere ka e gbuo ndị ya nʼagha; iwe ya dị ọkụ megide ihe nketa ya.
בחוריו אכלה-אש ובתולתיו לא הוללו | 63 |
Ọkụ repịara ụmụ okorobịa ha, ọ dịkwaghị onye a gụụrụ egwu ọlụlụ di na nwunye, nʼetiti ụmụ agbọghọ ha;
כהניו בחרב נפלו ואלמנתיו לא תבכינה | 64 |
E gburu ndị nchụaja ha nʼagha; ndị inyom ha ndị di ha nwụrụ enwekwaghị ike iru ụjụ.
ויקץ כישן אדני כגבור מתרונן מיין | 65 |
Mgbe ahụ, onyenwe anyị tetara dịka onye si nʼụra teta, dịka dike si nʼụra mmanya teta.
ויך-צריו אחור חרפת עולם נתן למו | 66 |
Ọ chụghachiri ndị iro ya azụ, mee ha ihe ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi.
וימאס באהל יוסף ובשבט אפרים לא בחר | 67 |
Ọ jụrụ ụlọ ikwu Josef, ọ họpụtaghị ebo Ifrem;
ויבחר את-שבט יהודה את-הר ציון אשר אהב | 68 |
ma ọ họọrọ ebo Juda, na ugwu Zayọn, nke ọ hụrụ nʼanya.
ויבן כמו-רמים מקדשו כארץ יסדה לעולם | 69 |
O wuru ụlọnsọ ya ka ọ dị ka ebe dị elu, dịka ụwa nke o mere ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.
ויבחר בדוד עבדו ויקחהו ממכלאת צאן | 70 |
Ọ họpụtara Devid, ohu ya, kpọrọ ya site nʼọgba igwe atụrụ;
מאחר עלות הביאו לרעות ביעקב עמו ובישראל נחלתו | 71 |
o si nʼebe ọ nọ na-azụ atụrụ kpọrọ ya, ka ọ bịa bụrụ onye na-azụ ndị ya Jekọb, na Izrel, ihe nketa ya dịka atụrụ.
וירעם כתם לבבו ובתבונות כפיו ינחם | 72 |
Devid ji izuoke nke obi ya zụọ ha, aka nke maara ihe ọ na-eme ka o ji duo ha.