< תהילים 74 >

משכיל לאסף למה אלהים זנחת לנצח יעשן אפך בצאן מרעיתך 1
Abụ maskil nke Asaf. Chineke, gịnị mere i ji jụ anyị ruo mgbe ebighị ebi? Gịnị mere iwe gị ji akwụ anwụrụ megide igwe atụrụ ndị ị na-azụ?
זכר עדתך קנית קדם-- גאלת שבט נחלתך הר-ציון זה שכנת בו 2
Cheta mba ahụ nke ị zụtara na mgbe ochie, ebo ahụ bụ ihe nketa gị, ndị ị gbapụtara, nʼugwu Zayọn ebe i biri.
הרימה פעמיך למשאות נצח כל-הרע אויב בקדש 3
Tụgharịa nzọ ụkwụ gị bịa na mbibi ebighị ebi ndị a. Ọ bụ onye iro wetara ịla nʼiyi a niile nʼụlọnsọ a.
שאגו צרריך בקרב מועדך שמו אותתם אתות 4
Ndị iro gị gbọrọ ụja nʼebe i zutere anyị. Ha weliri ọkọlọtọ ha dịka ihe ịrịbama.
יודע כמביא למעלה בסבך-עץ קרדמות 5
Ha kpara agwa dịka ndị ikom ji anyụike ha ga-eji gbutuo ọtụtụ osisi dị nʼoke ọhịa.
ועת (ועתה) פתוחיה יחד-- בכשיל וכילפות יהלמון 6
Ha ji anyụike na egbugbu ha kụjisie ihe niile eji amachi ihe bụ nke egbunyere ihe.
שלחו באש מקדשך לארץ חללו משכן-שמך 7
Ha kpọkwara ụlọnsọ gị ọkụ, mee ya ka o repịa. Ha merụrụ ụlọ obibi ahụ a kpọkwasịrị aha gị.
אמרו בלבם נינם יחד שרפו כל-מועדי-אל בארץ 8
Ha sịrị nʼobi ha, “Anyị ga-etipịa ha kpamkpam!” Ha kpọrọ ebe niile a na-anọ efe Chineke nʼala a ọkụ.
אותתינו לא ראינו אין-עוד נביא ולא-אתנו ידע עד-מה 9
Enyeghị anyị ihe ịrịbama ọbụla site nʼaka Chineke. Ọ dịkwaghị ndị amụma fọdụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti anyị onye maara, mgbe ihe a ga-agwụ.
עד-מתי אלהים יחרף צר ינאץ אויב שמך לנצח 10
O Chineke, ruo ole mgbe ka ndị iro ga-anọgide na-achị gị ọchị? Onye iro, ọ ga-eleli aha gị ruo mgbe ebighị ebi?
למה תשיב ידך וימינך מקרב חוקך (חיקך) כלה 11
Gịnị mere ị na-eseghachi aka gị azụ, e aka nri gị? Sepụta aka gị laa ha nʼiyi!
ואלהים מלכי מקדם פעל ישועות בקרב הארץ 12
Ma gị, O Chineke, bụrịị eze m site na mgbe ochie. Ọ bụ gị na-arụpụta nzọpụta nʼelu ụwa.
אתה פוררת בעזך ים שברת ראשי תנינים על-המים 13
Site nʼike gị dị ukwuu i mere ka osimiri kewaa abụọ. Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ nʼime mmiri.
אתה רצצת ראשי לויתן תתננו מאכל לעם לציים 14
Ọ bụ gị gwepịara isi anụ ọjọọ ahụ a na-akpọ leviatan, mee ka ọ ghọọ nri nye ụmụ anụmanụ bi nʼọzara.
אתה בקעת מעין ונחל אתה הובשת נהרות איתן 15
Ọ bụ gị mere ka isi iyi na mmiri iyi na-asọ. I mere ka osimiri na-eru eru mgbe niile taa.
לך יום אף-לך לילה אתה הכינות מאור ושמש 16
Ehihie na abalị bụ nke gị. I mere ka anyanwụ na ọnwa guzosie ike.
אתה הצבת כל-גבולות ארץ קיץ וחרף אתה יצרתם 17
Ọ bụ gị kewapụtara oke ala niile nke ụwa. Ọ bụ gị mere ka ọkọchị na udu mmiri dị.
זכר-זאת--אויב חרף יהוה ועם נבל נאצו שמך 18
O Onyenwe anyị, cheta otu onye iro si chịa gị ọchị, na otu ndị nzuzu si kwaa aha gị emo.
אל-תתן לחית נפש תורך חית ענייך אל-תשכח לנצח 19
Ewerala ndụ nduru gị nyefee anụ ọhịa ọjọọ nʼaka. Echefukwala ndụ ndị gị a na-akpagbu ruo mgbe ebighị ebi.
הבט לברית כי מלאו מחשכי-ארץ נאות חמס 20
Chetakwa ọgbụgba ndụ gị, nʼihi na ihe ike na-ejupụta ebe niile gbara ọchịchịrị nʼala a.
אל-ישב דך נכלם עני ואביון יהללו שמך 21
Ekwela ka ndị a na-akpagbu gbaghachi azụ nʼihere; ka ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa too aha gị.
קומה אלהים ריבה ריבך זכר חרפתך מני-נבל כל-היום 22
O Chineke, bilie, kpechitara onwe gị ikpe. Chetakwa otu ndị nzuzu si kọọ gị ọnụ ogologo ụbọchị niile.
אל-תשכח קול צרריך שאון קמיך עלה תמיד 23
Elepụla mkpọtụ nke ndị iro gị niile anya, olu mkpọtụ nke ndị iro gị na-aga nʼihu na-ala elu.

< תהילים 74 >