< תהילים 51 >

למנצח מזמור לדוד ב בבוא-אליו נתן הנביא-- כאשר-בא אל-בת-שבע ג חנני אלהים כחסדך כרב רחמיך מחה פשעי 1
Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile.
הרבה (הרב) כבסני מעוני ומחטאתי טהרני 2
Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha.
כי-פשעי אני אדע וחטאתי נגדי תמיד 3
Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
לך לבדך חטאתי והרע בעיניך עשיתי למען תצדק בדברך-- תזכה בשפטך 4
Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.
הן-בעוון חוללתי ובחטא יחמתני אמי 5
Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
הן-אמת חפצת בטחות ובסתם חכמה תודיעני 6
Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.
תחטאני באזוב ואטהר תכבסני ומשלג אלבין 7
Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.
תשמיעני ששון ושמחה תגלנה עצמות דכית 8
Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.
הסתר פניך מחטאי וכל-עונתי מחה 9
Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile.
לב טהור ברא-לי אלהים ורוח נכון חדש בקרבי 10
Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
אל-תשליכני מלפניך ורוח קדשך אל-תקח ממני 11
Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.
השיבה לי ששון ישעך ורוח נדיבה תסמכני 12
Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
אלמדה פשעים דרכיך וחטאים אליך ישובו 13
Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
הצילני מדמים אלהים-- אלהי תשועתי תרנן לשוני צדקתך 14
O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
אדני שפתי תפתח ופי יגיד תהלתך 15
O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị.
כי לא-תחפץ זבח ואתנה עולה לא תרצה 16
Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
זבחי אלהים רוח נשברה לב-נשבר ונדכה-- אלהים לא תבזה 17
Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị.
היטיבה ברצונך את-ציון תבנה חומות ירושלם 18
Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.
אז תחפץ זבחי-צדק עולה וכליל אז יעלו על-מזבחך פרים 19
Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.

< תהילים 51 >