< תהילים 47 >
למנצח לבני-קרח מזמור ב כל-העמים תקעו-כף הריעו לאלהים בקול רנה | 1 |
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. Kụọnụ aka unu, unu mba niile; jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
כי-יהוה עליון נורא מלך גדול על-כל-הארץ | 2 |
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
ידבר עמים תחתינו ולאמים תחת רגלינו | 3 |
O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
יבחר-לנו את-נחלתנו את גאון יעקב אשר-אהב סלה | 4 |
Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. (Sela)
עלה אלהים בתרועה יהוה בקול שופר | 5 |
Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
זמרו אלהים זמרו זמרו למלכנו זמרו | 6 |
Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.
כי מלך כל-הארץ אלהים-- זמרו משכיל | 7 |
Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. Jirinụ abụ too ya.
מלך אלהים על-גוים אלהים ישב על-כסא קדשו | 8 |
Chineke bụ eze mba niile; ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
נדיבי עמים נאספו-- עם אלהי אברהם כי לאלהים מגני-ארץ-- מאד נעלה | 9 |
Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, dịka ndị Chineke nke Ebraham, nʼihi na ndị eze niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.