< תהילים 41 >
למנצח מזמור לדוד ב אשרי משכיל אל-דל ביום רעה ימלטהו יהוה | 1 |
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye; Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.
יהוה ישמרהו ויחיהו--יאשר (ואשר) בארץ ואל-תתנהו בנפש איביו | 2 |
Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ; ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ, ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.
יהוה--יסעדנו על-ערש דוי כל-משכבו הפכת בחליו | 3 |
Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike, meekwa ka ahụ dị ha mma.
אני-אמרתי יהוה חנני רפאה נפשי כי-חטאתי לך | 4 |
Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere; gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”
אויבי--יאמרו רע לי מתי ימות ואבד שמו | 5 |
Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?”
ואם-בא לראות שוא ידבר--לבו יקבץ-און לו יצא לחוץ ידבר | 6 |
Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m, ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu; mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya.
יחד--עלי יתלחשו כל-שנאי עלי--יחשבו רעה לי | 7 |
Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:
דבר-בליעל יצוק בו ואשר שכב לא-יוסיף לקום | 8 |
“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.”
גם-איש שלומי אשר-בטחתי בו-- אוכל לחמי הגדיל עלי עקב | 9 |
Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m.
ואתה יהוה חנני והקימני ואשלמה להם | 10 |
Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.
בזאת ידעתי כי-חפצת בי כי לא-יריע איבי עלי | 11 |
Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi, nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.
ואני--בתמי תמכת בי ותציבני לפניך לעולם | 12 |
Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m, mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.
ברוך יהוה אלהי ישראל--מהעולם ועד העולם אמן ואמן | 13 |
Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.