< תהילים 38 >

מזמור לדוד להזכיר ב יהוה--אל-בקצפך תוכיחני ובחמתך תיסרני 1
Abụ Ọma Devid. Arịrịọ. Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.
כי-חציך נחתו בי ותנחת עלי ידך 2
Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.
אין-מתם בבשרי מפני זעמך אין-שלום בעצמי מפני חטאתי 3
Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.
כי עונתי עברו ראשי כמשא כבד יכבדו ממני 4
Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.
הבאישו נמקו חבורתי מפני אולתי 5
Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.
נעויתי שחתי עד-מאד כל-היום קדר הלכתי 6
Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.
כי-כסלי מלאו נקלה ואין מתם בבשרי 7
Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m.
נפוגותי ונדכיתי עד-מאד שאגתי מנהמת לבי 8
Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.
אדני נגדך כל-תאותי ואנחתי ממך לא-נסתרה 9
O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.
לבי סחרחר עזבני כחי ואור-עיני גם-הם אין אתי 10
Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.
אהבי ורעי--מנגד נגעי יעמדו וקרובי מרחק עמדו 11
Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.
וינקשו מבקשי נפשי ודרשי רעתי דברו הוות ומרמות כל-היום יהגו 12
Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.
ואני כחרש לא אשמע וכאלם לא יפתח-פיו 13
Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.
ואהי--כאיש אשר לא-שמע ואין בפיו תוכחות 14
Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.
כי-לך יהוה הוחלתי אתה תענה אדני אלהי 15
O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
כי-אמרתי פן-ישמחו-לי במוט רגלי עלי הגדילו 16
Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”
כי-אני לצלע נכון ומכאובי נגדי תמיד 17
Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
כי-עוני אגיד אדאג מחטאתי 18
Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m.
ואיבי חיים עצמו ורבו שנאי שקר 19
Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.
ומשלמי רעה תחת טובה-- ישטנוני תחת רדופי- (רדפי-) טוב 20
Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.
אל-תעזבני יהוה אלהי אל-תרחק ממני 21
O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.
חושה לעזרתי אדני תשועתי 22
Bịa ọsịịsọ inyere m aka Onyenwe m na Onye nzọpụta m.

< תהילים 38 >