< תהילים 33 >

רננו צדיקים ביהוה לישרים נאוה תהלה 1
Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume; nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.
הודו ליהוה בכנור בנבל עשור זמרו-לו 2
Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị; werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
שירו-לו שיר חדש היטיבו נגן בתרועה 3
Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ; were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.
כי-ישר דבר-יהוה וכל-מעשהו באמונה 4
Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu; o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.
אהב צדקה ומשפט חסד יהוה מלאה הארץ 5
Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya; ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.
בדבר יהוה שמים נעשו וברוח פיו כל-צבאם 6
Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile, jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.
כנס כנד מי הים נתן באוצרות תהומות 7
Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe, kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.
ייראו מיהוה כל-הארץ ממנו יגורו כל-ישבי תבל 8
Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu; ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.
כי הוא אמר ויהי הוא-צוה ויעמד 9
Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara; o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.
יהוה הפיר עצת-גוים הניא מחשבות עמים 10
Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile; ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.
עצת יהוה לעולם תעמד מחשבות לבו לדר ודר 11
Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.
אשרי הגוי אשר-יהוה אלהיו העם בחר לנחלה לו 12
Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha; bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.
משמים הביט יהוה ראה את-כל-בני האדם 13
Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya. Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.
ממכון-שבתו השגיח-- אל כל-ישבי הארץ 14
O sitere nʼebe obibi ya na-ele onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.
היצר יחד לבם המבין אל-כל-מעשיהם 15
Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu; ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.
אין-המלך נושע ברב-חיל גבור לא-ינצל ברב-כח 16
Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya; o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.
שקר הסוס לתשועה וברב חילו לא ימלט 17
Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha. Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.
הנה עין יהוה אל-יראיו למיחלים לחסדו 18
Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche, ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.
להציל ממות נפשם ולחיותם ברעב 19
Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ. Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.
נפשנו חכתה ליהוה עזרנו ומגננו הוא 20
Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị; ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.
כי-בו ישמח לבנו כי בשם קדשו בטחנו 21
Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya; nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.
יהי-חסדך יהוה עלינו כאשר יחלנו לך 22
O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị, dịka olileanya anyị dị na gị.

< תהילים 33 >