< תהילים 125 >
שיר המעלות הבטחים ביהוה-- כהר-ציון לא-ימוט לעולם ישב | 1 |
Abụ nrigo. Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
ירושלם-- הרים סביב לה ויהוה סביב לעמו-- מעתה ועד-עולם | 2 |
Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.
כי לא ינוח שבט הרשע-- על גורל הצדיקים למען לא-ישלחו הצדיקים בעולתה ידיהם | 3 |
Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.
היטיבה יהוה לטובים ולישרים בלבותם | 4 |
O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.
והמטים עקלקלותם-- יוליכם יהוה את-פעלי האון שלום על-ישראל | 5 |
Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe. Ka udo dịrị Izrel.