< תהילים 124 >
שיר המעלות לדוד לולי יהוה שהיה לנו-- יאמר-נא ישראל | 1 |
Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,
לולי יהוה שהיה לנו-- בקום עלינו אדם | 2 |
a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
אזי חיים בלעונו-- בחרות אפם בנו | 3 |
mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;
אזי המים שטפונו-- נחלה עבר על-נפשנו | 4 |
idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,
אזי עבר על-נפשנו-- המים הזידונים | 5 |
ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.
ברוך יהוה-- שלא נתננו טרף לשניהם | 6 |
Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
נפשנו-- כצפור נמלטה מפח יוקשים הפח נשבר ואנחנו נמלטנו | 7 |
Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
עזרנו בשם יהוה-- עשה שמים וארץ | 8 |
Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.