< תהילים 122 >
שיר המעלות לדוד שמחתי באמרים לי-- בית יהוה נלך | 1 |
Abụ nrigo, nke Devid. Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, “Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”
עמדות היו רגלינו-- בשעריך ירושלם | 2 |
Ụkwụ anyị eguzola ugbu a nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem.
ירושלם הבנויה-- כעיר שחברה-לה יחדו | 3 |
E wuru Jerusalem dịka obodo a chịkọtara ọnụ nke ọma.
ששם עלו שבטים שבטי-יה--עדות לישראל להדות לשם יהוה | 4 |
Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, ịbụku aha Onyenwe anyị abụ dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị.
כי שמה ישבו כסאות למשפט כסאות לבית דוד | 5 |
Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid.
שאלו שלום ירושלם ישליו אהביך | 6 |
Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: “Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo.
יהי-שלום בחילך שלוה בארמנותיך | 7 |
Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.”
למען אחי ורעי-- אדברה-נא שלום בך | 8 |
Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.”
למען בית-יהוה אלהינו-- אבקשה טוב לך | 9 |
Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, aga m achọ ọganihu gị.