< תהילים 114 >
בצאת ישראל ממצרים בית יעקב מעם לעז | 1 |
Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta,
היתה יהודה לקדשו ישראל ממשלותיו | 2 |
Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, Izrel ghọrọ ala ọ na-achị.
הים ראה וינס הירדן יסב לאחור | 3 |
Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ, osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ;
ההרים רקדו כאילים גבעות כבני-צאן | 4 |
Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ.
מה-לך הים כי תנוס הירדן תסב לאחור | 5 |
Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ?
ההרים תרקדו כאילים גבעות כבני-צאן | 6 |
Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ?
מלפני אדון חולי ארץ מלפני אלוה יעקב | 7 |
Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb,
ההפכי הצור אגם-מים חלמיש למעינו-מים | 8 |
onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.