< תהילים 110 >

לדוד מזמור נאם יהוה לאדני--שב לימיני עד-אשית איביך הדם לרגליך 1
Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị gwara Onyenwe m okwu sị ya: “Nọdụ ala nʼaka nri m ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.”
מטה-עזך--ישלח יהוה מציון רדה בקרב איביך 2
Onyenwe anyị ga-eme ka ike ọchịchị gị site na Zayọn ruo ala ndị ọzọ; ị ga-achị nʼetiti ndị iro gị niile.
עמך נדבת ביום חילך בהדרי-קדש מרחם משחר לך טל ילדתיך 3
Nʼụbọchị ị ga-ebu agha, ndị agha gị niile ga-ahọrọ nʼonwe ha i soro gị. Ndị yikwasịrị ịma mma nke ịdị nsọ ka uwe, bụ ụmụ okorobịa gị ga-abịakwute gị dịka igirigi site nʼafọ ụtụtụ.
נשבע יהוה ולא ינחם-- אתה-כהן לעולם על-דברתי מלכי-צדק 4
Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe uche ya: “Gị onwe gị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, nʼusoro Melkizedek.”
אדני על-ימינך מחץ ביום-אפו מלכים 5
Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.
ידין בגוים מלא גויות מחץ ראש על-ארץ רבה 6
Ọ ga-ekpe mba niile ikpe, na-atụkọta ndị nwụrụ anwụ, ma gwepịa ndị na-achị achị nʼelu ụwa niile.
מנחל בדרך ישתה על-כן ירים ראש 7
Ọ ga-aṅụ mmiri site nʼiyi nta nke dị nʼakụkụ ụzọ; nʼihi nke a, ọ ga-eweli isi ya elu.

< תהילים 110 >