< מִשְׁלֵי 31 >
דברי למואל מלך-- משא אשר-יסרתו אמו | 1 |
Ndị a bụ okwu si nʼọnụ Lemuel, eze Masa. Ha bụ okwu ndị ahụ nne eze Lemuel kuziri ya.
מה-ברי ומה-בר-בטני ומה בר-נדרי | 2 |
Gee ntị, nwa m, gee ntị, nwa nke afọ m. Gee ntị, nwa m, nwa nke ọziza ekpere m niile.
אל-תתן לנשים חילך ודרכיך למחות מלכין | 3 |
Enyela ụmụ nwanyị ike gị, enyekwela ịdị ike gị nʼaka ndị nʼala ndị eze nʼiyi.
אל למלכים למואל--אל למלכים שתו-יין ולרוזנים או (אי) שכר | 4 |
Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze.
פן-ישתה וישכח מחקק וישנה דין כל-בני-עני | 5 |
Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta.
תנו-שכר לאובד ויין למרי נפש | 6 |
Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.
ישתה וישכח רישו ועמלו לא יזכר-עוד | 7 |
Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha.
פתח-פיך לאלם אל-דין כל-בני חלוף | 8 |
Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
פתח-פיך שפט-צדק ודין עני ואביון | 9 |
Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi. Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha.
אשת-חיל מי ימצא ורחק מפנינים מכרה | 10 |
Nwanyị nwere ugwu onye ga-achọtali ya? Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
בטח בה לב בעלה ושלל לא יחסר | 11 |
Di nwanyị dị otu a na-atụkwasị obi ya niile nʼime ya, ọ dịghị ihe dị mkpa nke na-akọ ya.
גמלתהו טוב ולא-רע-- כל ימי חייה | 12 |
Ihe nwanyị dị otu a na-ewetara di ya bụ naanị ihe ọma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị esi nʼaka ya abịakwasị di ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
דרשה צמר ופשתים ותעש בחפץ כפיה | 13 |
Ọ na-ahọrọ ajị anụ na flakisi jiri ya na-arụ ọrụ na-atọ aka ya ụtọ.
היתה כאניות סוחר ממרחק תביא לחמה | 14 |
Ọ na-esite nʼebe dị anya na-ebubata ihe oriri nʼụlọ ya dịka a ga-asị na ọ bụ ụgbọ mmiri.
ותקם בעוד לילה--ותתן טרף לביתה וחק לנערתיה | 15 |
Tupu chi abọzie, nwanyị a esitelarị nʼihe ndina bilie kwadooro ezinaụlọ ya ihe oriri, ma debekwara odibo ndị inyom na-ejere ya ozi oke ihe oriri nke ha.
זממה שדה ותקחהו מפרי כפיה נטע (נטעה) כרם | 16 |
Ọ na-apụ nyochapụta ịdị mma ala ubi, ma zụpụta ya. Ọ bụ ego ọ rụpụtara nʼonwe ya ka o ji arụ ọrụ ubi vaịnị.
חגרה בעוז מתניה ותאמץ זרועתיה | 17 |
Ike ịrụ ọrụ adịghị agwụ ya. Ọ dị nnọọ ike, bụrụkwa onye na-arụpụta ihe dị iche iche.
טעמה כי-טוב סחרה לא-יכבה בליל (בלילה) נרה | 18 |
Ọ na-elezi anya hụ na ihe ahịa o mepụtara dị ezi oke ọnụahịa; ọ bụ nke a mere o ji na-arụ ọrụ ruo nʼime ime abalị.
ידיה שלחה בכישור וכפיה תמכו פלך | 19 |
Nʼọbụaka ya ka o jidere osisi ịtụ ogho akwa; mkpịsịaka ya na-ejidesikwa ozele e ji na-ekwe akwa ike.
כפה פרשה לעני וידיה שלחה לאביון | 20 |
Ọ na-agbasapụ aka inyere ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa aka.
לא-תירא לביתה משלג כי כל-ביתה לבש שנים | 21 |
Udu mmiri maọbụ oge oke oyi adịghị eche ya uche nʼihi na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya nwere uwe ha ga-eji chụọ oyi.
מרבדים עשתה-לה שש וארגמן לבושה | 22 |
Ọ na-akpa akwa a na-agbasa nʼelu ihe ndina, ma ya onwe ya na-eyikwa uwe e ji ezi akwa ọcha na akwa odo odo dụọ.
נודע בשערים בעלה בשבתו עם-זקני-ארץ | 23 |
Di ya bụ onye a na-asọpụrụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ebe ọ na-ewere ọnọdụ nʼetiti ndị okenye nke ala ahụ.
סדין עשתה ותמכר וחגור נתנה לכנעני | 24 |
Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
עז-והדר לבושה ותשחק ליום אחרון | 25 |
Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
פיה פתחה בחכמה ותורת חסד על-לשונה | 26 |
Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
צופיה הילכות (הליכות) ביתה ולחם עצלות לא תאכל | 27 |
Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
קמו בניה ויאשרוה בעלה ויהללה | 28 |
Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.
רבות בנות עשו חיל ואת עלית על-כלנה | 29 |
Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”
שקר החן והבל היפי אשה יראת-יהוה היא תתהלל | 30 |
Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.
תנו-לה מפרי ידיה ויהללוה בשערים מעשיה | 31 |
E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.