< מִשְׁלֵי 3 >

בני תורתי אל-תשכח ומצותי יצר לבך 1
Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị.
כי ארך ימים ושנות חיים-- ושלום יוסיפו לך 2
Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
חסד ואמת אל-יעזבך קשרם על-גרגרותיך כתבם על-לוח לבך 3
Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
ומצא-חן ושכל-טוב-- בעיני אלהים ואדם 4
Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
בטח אל-יהוה בכל-לבך ואל-בינתך אל-תשען 5
Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
בכל-דרכיך דעהו והוא יישר ארחתיך 6
Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
אל-תהי חכם בעיניך ירא את-יהוה וסור מרע 7
A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
רפאות תהי לשרך ושקוי לעצמותיך 8
Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
כבד את-יהוה מהונך ומראשית כל-תבואתך 9
Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
וימלאו אסמיך שבע ותירוש יקביך יפרצו 10
Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.
מוסר יהוה בני אל-תמאס ואל-תקץ בתוכחתו 11
Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
כי את אשר יאהב יהוה יוכיח וכאב את-בן ירצה 12
Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
אשרי אדם מצא חכמה ואדם יפיק תבונה 13
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
כי טוב סחרה מסחר-כסף ומחרוץ תבואתה 14
Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
יקרה היא מפניים (מפנינים) וכל-חפציך לא ישוו-בה 15
Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
ארך ימים בימינה בשמאולה עשר וכבוד 16
Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
דרכיה דרכי-נעם וכל-נתיבותיה שלום 17
Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.
עץ-חיים היא למחזיקים בה ותמכיה מאשר 18
Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.
יהוה--בחכמה יסד-ארץ כונן שמים בתבונה 19
Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.
בדעתו תהומות נבקעו ושחקים ירעפו-טל 20
Esitere nʼihe ọmụma ya kewaa ogbu mmiri niile, igwe ojii na-atụdakwa igirigi.
בני אל-ילזו מעיניך נצר תשיה ומזמה 21
Nwa m nwoke, ekwela ka ihe abụọ ndị a site nʼihu gị wezuga onwe ha: amamihe na nghọta nke ime ihe dị mma nʼizuzu zuruoke,
ויהיו חיים לנפשך וחן לגרגרתיך 22
nʼihi na ha na-enye gị ndụ ọhụrụ, ha bụkwaara gị ihe ịchọ mma amara nʼolu gị.
אז תלך לבטח דרכך ורגלך לא תגוף 23
Ha na-eme ka ị na-aga ije nʼụzọ gị na-enweghị ihe egwu maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ.
אם-תשכב לא-תפחד ושכבת וערבה שנתך 24
Mgbe ị ga-edina ala, ị gaghị atụ egwu, ị ga-edina ala ụra gị ga-adị ụtọ.
אל-תירא מפחד פתאם ומשאת רשעים כי תבא 25
Ị gaghị atụ egwu ihe mbibi mberede ọbụla maọbụ tụọ egwu ịla nʼiyi nke na-abịakwasị ndị ajọ omume.
כי-יהוה יהיה בכסלך ושמר רגלך מלכד 26
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ ebe ndabere gị, ọ ga-echebekwa gị.
אל-תמנע-טוב מבעליו-- בהיות לאל ידיך (ידך) לעשות 27
Ejigidele ihe ọma ị pụrụ imere onye ọzọ mgbe ọ dị gị nʼaka ime ya.
אל-תאמר לרעיך (לרעך) לך ושוב--ומחר אתן ויש אתך 28
A sịkwala onye agbataobi gị laa, bịaghachi azụ echi mgbe i nwere ike ime ya taa.
אל-תחרש על-רעך רעה והוא-יושב לבטח אתך 29
Agbala izu ọjọọ megide onye agbataobi gị, nʼihi na o nwere ntụkwasị obi nʼebe ị nọ.
אל-תרוב (תריב) עם-אדם חנם-- אם-לא גמלך רעה 30
Ebola mmadụ ebubo na-enweghị isi, mgbe onye ahụ na-emeghị gị ihe ọjọọ ọbụla.
אל-תקנא באיש חמס ואל-תבחר בכל-דרכיו 31
Ekwosola onye na-eme ihe ike ekworo maọbụ họrọ ụzọ ya ọbụla.
כי תועבת יהוה נלוז ואת-ישרים סודו 32
Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
מארת יהוה בבית רשע ונוה צדיקים יברך 33
Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
אם-ללצים הוא-יליץ ולעניים (ולענוים) יתן-חן 34
Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
כבוד חכמים ינחלו וכסילים מרים קלון 35
Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.

< מִשְׁלֵי 3 >