< במדבר 33 >

אלה מסעי בני ישראל אשר יצאו מארץ מצרים--לצבאתם ביד משה ואהרן 1
Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.
ויכתב משה את מוצאיהם למסעיהם--על פי יהוה ואלה מסעיהם למוצאיהם 2
Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
ויסעו מרעמסס בחדש הראשון בחמשה עשר יום לחדש הראשון ממחרת הפסח יצאו בני ישראל ביד רמה--לעיני כל מצרים 3
Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
ומצרים מקברים את אשר הכה יהוה בהם--כל בכור ובאלהיהם עשה יהוה שפטים 4
mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
ויסעו בני ישראל מרעמסס ויחנו בסכת 5
Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
ויסעו מסכת ויחנו באתם אשר בקצה המדבר 6
Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
ויסעו מאתם וישב על פי החירת אשר על פני בעל צפון ויחנו לפני מגדל 7
Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
ויסעו מפני החירת ויעברו בתוך הים המדברה וילכו דרך שלשת ימים במדבר אתם ויחנו במרה 8
Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
ויסעו ממרה ויבאו אילמה ובאילם שתים עשרה עינת מים ושבעים תמרים--ויחנו שם 9
Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
ויסעו מאילם ויחנו על ים סוף 10
Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
ויסעו מים סוף ויחנו במדבר סין 11
Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
ויסעו ממדבר סין ויחנו בדפקה 12
Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka.
ויסעו מדפקה ויחנו באלוש 13
Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha.
ויסעו מאלוש ויחנו ברפידם ולא היה שם מים לעם לשתות 14
Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ.
ויסעו מרפידם ויחנו במדבר סיני 15
Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו ממדבר סיני ויחנו בקברת התאוה 16
Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מקברת התאוה ויחנו בחצרת 17
Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מחצרת ויחנו ברתמה 18
Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מרתמה ויחנו ברמן פרץ 19
Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מרמן פרץ ויחנו בלבנה 20
Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מלבנה ויחנו ברסה 21
Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מרסה ויחנו בקהלתה 22
Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מקהלתה ויחנו בהר שפר 23
Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מהר שפר ויחנו בחרדה 24
Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מחרדה ויחנו במקהלת 25
Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו ממקהלת ויחנו בתחת 26
Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מתחת ויחנו בתרח 27
Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מתרח ויחנו במתקה 28
Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו ממתקה ויחנו בחשמנה 29
Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מחשמנה ויחנו במסרות 30
Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו ממסרות ויחנו בבני יעקן 31
Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מבני יעקן ויחנו בחר הגדגד 32
Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מחר הגדגד ויחנו ביטבתה 33
Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מיטבתה ויחנו בעברנה 34
Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מעברנה ויחנו בעצין גבר 35
Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מעצין גבר ויחנו במדבר צן הוא קדש 36
Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.
ויסעו מקדש ויחנו בהר ההר בקצה ארץ אדום 37
Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm.
ויעל אהרן הכהן אל הר ההר על פי יהוה--וימת שם בשנת הארבעים לצאת בני ישראל מארץ מצרים בחדש החמישי באחד לחדש 38
Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.
ואהרן בן שלש ועשרים ומאת שנה במתו בהר ההר 39
Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
וישמע הכנעני מלך ערד והוא ישב בנגב בארץ כנען--בבא בני ישראל 40
Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
ויסעו מהר ההר ויחנו בצלמנה 41
Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מצלמנה ויחנו בפונן 42
Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מפונן ויחנו באבת 43
Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מאבת ויחנו בעיי העברים בגבול מואב 44
Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab.
ויסעו מעיים ויחנו בדיבן גד 45
Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מדיבן גד ויחנו בעלמן דבלתימה 46
Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מעלמן דבלתימה ויחנו בהרי העברים לפני נבו 47
Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויסעו מהרי העברים ויחנו בערבת מואב על ירדן ירחו 48
Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
ויחנו על הירדן מבית הישמת עד אבל השטים בערבת מואב 49
Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
וידבר יהוה אל משה בערבת מואב על ירדן ירחו לאמר 50
Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,
דבר אל בני ישראל ואמרת אלהם כי אתם עברים את הירדן אל ארץ כנען 51
“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
והורשתם את כל ישבי הארץ מפניכם ואבדתם את כל משכיתם ואת כל צלמי מסכתם תאבדו ואת כל במותם תשמידו 52
unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.
והורשתם את הארץ וישבתם בה כי לכם נתתי את הארץ לרשת אתה 53
Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
והתנחלתם את הארץ בגורל למשפחתיכם לרב תרבו את נחלתו ולמעט תמעיט את נחלתו--אל אשר יצא לו שמה הגורל לו יהיה למטות אבתיכם תתנחלו 54
Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.
ואם לא תורישו את ישבי הארץ מפניכם--והיה אשר תותירו מהם לשכים בעיניכם ולצנינם בצדיכם וצררו אתכם--על הארץ אשר אתם ישבים בה 55
“‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya.
והיה כאשר דמיתי לעשות להם--אעשה לכם 56
Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’”

< במדבר 33 >