< במדבר 30 >

וידבר משה אל ראשי המטות לבני ישראל לאמר זה הדבר אשר צוה יהוה 1
Mosis kpọkọtara ndị ndu ebo Izrel niile gwa ha sị: “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu:
איש כי ידר נדר ליהוה או השבע שבעה לאסר אסר על נפשו--לא יחל דברו ככל היצא מפיו יעשה 2
Mgbe nwoke ọbụla kwere Onyenwe anyị nkwa, maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla, ọ gaghị emebi nkwa dị otu a. Kama ọ ga-emezu ihe niile dịka o kwuru ya.
ואשה כי תדר נדר ליהוה ואסרה אסר בבית אביה בנעריה 3
“Ọ bụrụ na nwaagbọghọ nọ nʼụlọ nna ya ekwe Onyenwe anyị nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ọbụla,
ושמע אביה את נדרה ואסרה אשר אסרה על נפשה והחריש לה אביה--וקמו כל נדריה וכל אסר אשר אסרה על נפשה יקום 4
ọ bụrụ na nna ya anụ mgbe ọ na-ekwe nkwa maọbụ ṅụọ iyi ime ihe ahụ, ma gba ya nkịtị, onye dị otu a aghaghị imezu nkwa niile ndị ahụ o kwere.
ואם הניא אביה אתה ביום שמעו--כל נדריה ואסריה אשר אסרה על נפשה לא יקום ויהוה יסלח לה כי הניא אביה אתה 5
Ma ọ bụrụ na nna ya ajụ mgbe ọ nụrụ banyere ya na ọ gaghị emezu nkwa dị otu ahụ, mgbe ahụ, nkwa ahụ maọbụ iyi ọ ṅụrụ ga-abụ ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya, nʼihi na nna ya jụrụ na ọ ga-emezu nkwa ya.
ואם היו תהיה לאיש ונדריה עליה או מבטא שפתיה אשר אסרה על נפשה 6
“Ọ bụrụ na o mesịa lụọ dị, mgbe ọ ṅụsịrị iyi, maọbụ kwee nkwa nzuzu o kwesiri imezu,
ושמע אישה ביום שמעו והחריש לה וקמו נדריה ואסרה אשר אסרה על נפשה--יקמו 7
di ya nụ banyere ya ma gba ya nkịtị nʼụbọchị ahụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ ga-eguzogide, ọ ga-emezu ya.
ואם ביום שמע אישה יניא אותה והפר את נדרה אשר עליה ואת מבטא שפתיה אשר אסרה על נפשה--ויהוה יסלח לה 8
Ma ọ bụrụ na di ya ajụ ịnabata nkwa ahụ, maọbụ ọṅụṅụ iyi nzuzu ahụ, ọjụjụ di ya jụrụ nkwa ahụ ga-eme ka iyi ahụ maọbụ nkwa ahụ ghara ịdị ire. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.
ונדר אלמנה וגרושה--כל אשר אסרה על נפשה יקום עליה 9
“Ma nkwa ọbụla nke nwanyị di ya nwụrụ maọbụ nwanyị ya na di ya kewara, ihe ọbụla nke o ji ọnụ ya kwuo ka ọ ghaghị imezu.
ואם בית אישה נדרה או אסרה אסר על נפשה בשבעה 10
“Ma ọ bụrụ na nwanyị ya na di ya bi e kwee nkwa maọbụ site na kwagide ṅụọ iyi,
ושמע אישה והחרש לה לא הניא אתה--וקמו כל נדריה וכל אסר אשר אסרה על נפשה יקום 11
di ya nụ ihe banyere ya, ma gba nkịtị maọbụ ogbochighị ya, mgbe ahụ, ịṅụ iyi na nkwa ndị ahụ niile nke o kwere ga-eguzo.
ואם הפר יפר אתם אישה ביום שמעו--כל מוצא שפתיה לנדריה ולאסר נפשה לא יקום אישה הפרם ויהוה יסלח לה 12
Ma ọ bụrụ na di ya jụrụ ikwenye ka nkwa ahụ dịgide nʼụbọchị mbụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ maọbụ ọṅụṅụ iyi ahụ aghọọla ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya.
כל נדר וכל שבעת אסר לענת נפש--אישה יקימנו ואישה יפרנו 13
Ya mere, di ya nwere ike ịjụ, maọbụ mesie nkwa ahụ, maọbụ iyi ahụ ọ ṅụrụ ike.
ואם החרש יחריש לה אישה מיום אל יום והקים את כל נדריה או את כל אסריה אשר עליה--הקים אתם כי החרש לה ביום שמעו 14
Ọ bụrụ na di ya ekwughị ihe ọbụla site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị ọzọ, mgbe ahụ, o gosiri na o kwenyere ka nwunye ya mezuo nkwa maọbụ iyi ndị ahụ niile.
ואם הפר יפר אתם אחרי שמעו--ונשא את עונה 15
Ọ bụrụ na o mesịa jụ na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ ọ kwere, ikpe ọmụma niile dị nʼihi emezughị nkwa ahụ dị ya nʼisi.”
אלה החקים אשר צוה יהוה את משה בין איש לאשתו--בין אב לבתו בנעריה בית אביה 16
Ndị a bụ usoro iwu Onyenwe anyị nyere Mosis banyere mmekọrịta nke nwoke na nwunye ya. Ọ metụtakwara nna na nwa ya nwanyị onye bi nʼụlọ ya.

< במדבר 30 >