< איוב 35 >

ויען אליהו ויאמר 1
Mgbe ahụ, Elihu sịrị:
הזאת חשבת למשפט אמרת צדקי מאל 2
“Ị na-eche na nke a ziri ezi? Ị sịrị, ‘Na m ziri ezi ọ bụghị Chineke.’
כי-תאמר מה-יסכן-לך מה-אעיל מחטאתי 3
Nʼagbanyeghị ihe ndị a, ị na-ajụ ya si, ‘Uru gịnị ka ọ baara m, gịnị bụ uru m ma ọ bụrụ na emehieghị m?’
אני אשיבך מלין-- ואת-רעיך עמך 4
“Ọ ga-amasị m ịzaghachi gị, zaghachikwa ndị enyi gị na ha nọ.
הבט שמים וראה ושור שחקים גבהו ממך 5
Lelie anya na eluigwe ma hụkwa. Legide mbara igwe na igwe oji niile, nke dị anya karịa gị.
אם-חטאת מה-תפעל-בו ורבו פשעיך מה-תעשה-לו 6
Ọ bụrụ na i mehie, olee ụzọ nke a si metụta ya? Ọ bụrụ na mmehie gị bara ụba, gịnị ka nke a pụrụ ime ya?
אם-צדקת מה-תתן-לו או מה-מידך יקח 7
Ọ bụrụ na ị bụ onye ezi omume, gịnị ka ị na-enye ya, maọbụ gịnị ka ọ na-anata site nʼaka gị?
לאיש-כמוך רשעך ולבן-אדם צדקתך 8
Ajọ omume gị na-emetụta naanị mmadụ dịka gị, ma ezi omume gị na-emetụta naanị ụmụ ndị mmadụ.
מרב עשוקים יזעיקו ישועו מזרוע רבים 9
“Ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa nʼihi ịba ụba nke mmegbu, ha na-arịọ arịrịọ enyemaka site nʼaka ndị dị ike.
ולא-אמר--איה אלוה עשי נתן זמרות בלילה 10
Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ, onye na-enye abụ nʼime abalị,
מלפנו מבהמות ארץ ומעוף השמים יחכמנו 11
onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’
שם יצעקו ולא יענה-- מפני גאון רעים 12
Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
אך-שוא לא-ישמע אל ושדי לא ישורנה 13
Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
אף כי-תאמר לא תשורנו דין לפניו ותחולל לו 14
Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya!
ועתה--כי-אין פקד אפו ולא-ידע בפש מאד 15
Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
ואיוב הבל יפצה-פיהו בבלי-דעת מלין יכבר 16
Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe; ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”

< איוב 35 >