< איוב 24 >
מדוע--משדי לא-נצפנו עתים וידעו לא-חזו ימיו | 1 |
“Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe? Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?
גבלות ישיגו עדר גזלו וירעו | 2 |
Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala, na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.
חמור יתומים ינהגו יחבלו שור אלמנה | 3 |
Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
יטו אבינים מדרך יחד חבאו עניי-ארץ | 4 |
Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
הן פראים במדבר-- יצאו בפעלם משחרי לטרף ערבה לו לחם לנערים | 5 |
Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara, otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri, ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
בשדה בלילו יקצירו (יקצורו) וכרם רשע ילקשו | 6 |
Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
ערום ילינו מבלי לבוש ואין כסות בקרה | 7 |
Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị, ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.
מזרם הרים ירטבו ומבלי מחסה חבקו-צור | 8 |
Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
יגזלו משד יתום ועל-עני יחבלו | 9 |
Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara. Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.
ערום הלכו בלי לבוש ורעבים נשאו עמר | 10 |
Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị, ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
בין-שורתם יצהירו יקבים דרכו ויצמאו | 11 |
Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
מעיר מתים ינאקו-- ונפש-חללים תשוע ואלוה לא-ישים תפלה | 12 |
Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.
המה היו--במרדי-אור לא-הכירו דרכיו ולא ישבו בנתיבתיו | 13 |
“Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
לאור יקום רוצח--יקטל-עני ואביון ובלילה יהי כגנב | 14 |
Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
ועין נאף שמרה נשף לאמר-- לא-תשורני עין וסתר פנים ישים | 15 |
Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
חתר בחשך בתים יומם חתמו-למו לא-ידעו אור | 16 |
Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
כי יחדו בקר למו צלמות כי-יכיר בלהות צלמות | 17 |
Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.
קל-הוא על-פני-מים-- תקלל חלקתם בארץ לא-יפנה דרך כרמים | 18 |
“Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
ציה גם-חם יגזלו מימי-שלג שאול חטאו (Sheol ) | 19 |
Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. (Sheol )
ישכחהו רחם מתקו רמה-- עוד לא-יזכר ותשבר כעץ עולה | 20 |
Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi.
רעה עקרה לא תלד ואלמנה לא ייטיב | 21 |
Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.
ומשך אבירים בכחו יקום ולא-יאמין בחיין | 22 |
Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.
יתן-לו לבטח וישען ועיניהו על-דרכיהם | 23 |
Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
רומו מעט ואיננו והמכו ככל יקפצון וכראש שבלת ימלו | 24 |
A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.
ואם-לא אפו מי יכזיבני וישם לאל מלתי | 25 |
“Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”