< איוב 23 >
גם-היום מרי שחי ידי כבדה על-אנחתי | 2 |
“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.
מי-יתן ידעתי ואמצאהו אבוא עד-תכונתו | 3 |
A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya; a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!
אערכה לפניו משפט ופי אמלא תוכחות | 4 |
Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.
אדעה מלים יענני ואבינה מה-יאמר לי | 5 |
Aga m achọpụta ihe o ga-aza m ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.
הברב-כח יריב עמדי לא אך-הוא ישם בי | 6 |
Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.
שם--ישר נוכח עמו ואפלטה לנצח משפטי | 7 |
Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya. Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.
הן קדם אהלך ואיננו ואחור ולא-אבין לו | 8 |
“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.
שמאול בעשתו ולא-אחז יעטף ימין ולא אראה | 9 |
Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.
כי-ידע דרך עמדי בחנני כזהב אצא | 10 |
Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,
באשרו אחזה רגלי דרכו שמרתי ולא-אט | 11 |
ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.
מצות שפתיו ולא אמיש מחקי צפנתי אמרי-פיו | 12 |
Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.
והוא באחד ומי ישיבנו ונפשו אותה ויעש | 13 |
“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.
כי ישלים חקי וכהנה רבות עמו | 14 |
Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.
על-כן מפניו אבהל אתבונן ואפחד ממנו | 15 |
Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.
ואל הרך לבי ושדי הבהילני | 16 |
Chineke emeela ka obi m daa mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.
כי-לא נצמתי מפני-חשך ומפני כסה-אפל | 17 |
Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m, bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.