< איוב 20 >

ויען צפר הנעמתי ויאמר 1
Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
לכן שעפי ישיבוני ובעבור חושי בי 2
“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.
מוסר כלמתי אשמע ורוח מבינתי יענני 3
Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m, ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.
הזאת ידעת מני-עד מני שים אדם עלי-ארץ 4
“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie, ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.
כי רננת רשעים מקרוב ושמחת חנף עדי-רגע 5
Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta, ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.
אם-יעלה לשמים שיאו וראשו לעב יגיע 6
Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe, na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;
כגללו לנצח יאבד ראיו יאמרו איו 7
ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ; ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’
כחלום יעוף ולא ימצאהו וידד כחזיון לילה 8
Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla, dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.
עין שזפתו ולא תוסיף ולא-עוד תשורנו מקומו 9
Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ, ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.
בניו ירצו דלים וידיו תשבנה אונו 10
Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye; aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.
עצמותיו מלאו עלומו ועמו על-עפר תשכב 11
Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.
אם-תמתיק בפיו רעה-- יכחידנה תחת לשנו 12
“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ, na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;
יחמל עליה ולא יעזבנה וימנענה בתוך חכו 13
ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya, ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,
לחמו במעיו נהפך מרורת פתנים בקרבו 14
ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya, ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.
חיל בלע ויקאנו מבטנו ירשנו אל 15
Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara; Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.
ראש-פתנים יינק תהרגהו לשון אפעה 16
Ọ ga-amịcha elo agwọ, eze agwọ ajụala ga-egbu ya.
אל-ירא בפלגות-- נהרי נחלי דבש וחמאה 17
Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi, bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
משיב יגע ולא יבלע כחיל תמורתו ולא יעלס 18
Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu. Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.
כי-רצץ עזב דלים בית גזל ולא יבנהו 19
Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla, ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.
כי לא-ידע שלו בבטנו בחמודו לא ימלט 20
“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya; ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.
אין-שריד לאכלו על-כן לא-יחיל טובו 21
Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa, ọganihu ya agaghị adịgide.
במלאות שפקו יצר לו כל-יד עמל תבאנו 22
Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya, oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.
יהי למלא בטנו--ישלח-בו חרון אפו וימטר עלימו בלחומו 23
Mgbe o rijuru afọ ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya, iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.
יברח מנשק ברזל תחלפהו קשת נחושה 24
Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga, àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
שלף ויצא מגוה וברק ממררתו יהלך עליו אמים 25
Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya, site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma. Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.
כל-חשך טמון לצפוניו תאכלהו אש לא-נפח ירע שריד באהלו 26
Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya, ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
יגלו שמים עונו וארץ מתקוממה לו 27
Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya ụwa niile ga-ebili megide ya.
יגל יבול ביתו נגרות ביום אפו 28
Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya; oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.
זה חלק-אדם רשע--מאלהים ונחלת אמרו מאל 29
Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu, ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”

< איוב 20 >